Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 4:10 - Bible Nso

10 Juda we si, Ike nke ndi-ibu ebilatawo, ma nkpọnkpọ-ihe riri nne; ayi onwe-ayi apughi kwa ilu mb͕idi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Mgbe ahụ, ndị Juda bidoro itamu ntamu na-asị, na ike ebidola ịgwụ ndị ọrụ ha, na mkpọmkpọ ihe fọdụrụ ka buru ibu, na naanị anyị apụghị ịrụcha mgbidi ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 4:10
10 Iomraidhean Croise  

O we me orú nnù uzọ asatọ na nnù iri-na-ise nime ha ka ha buru ndi-ibu, na orú nnù uzọ iri ka ha buru ndi nāwa ihe-ọwuwa n'ugwu, na nnù iteghete ka ha buru ndi edoro ndi-isi ime ka ndi ahu fè òfùfè.


Ha bu kwa ndi-isi nke ndi-ibu, ha nēdu kwa ndi nile nēje ozi ifè òfùfè ọ bula: ufọdu nime ndi Livai bu kwa ndi-ode-akwukwọ, na ndi-odozi-okwu, na ndi-ọnu-ama.


Ndi nākpab͕u ayi we si, Ha agaghi-ama, ha agaghi-ahu kwa, rue mb͕e ayi batara n'etiti ha, b͕ue ha, me ka ije-ozi ahu kwusi.


O kwue okwu n'iru umu-nne-ya na usu-ndi-agha Sameria, si, Gini ka ndi-Ju ndia ndi nāta aru nēme? hà gārapuru onwe-ha ihe? hà gāchu àjà? hà gēme ka ọlu-ha gwusia n'otù ubọchi? hà gēsi n'obo ájá me ka nkume di adi ọzọ, ebe nkume ahu nile bu ihe akpọworo ọku?


Ayi we kpere Chineke-ayi, guzo ndi-nche megide ha ehihie na abali, n'ihi ha.


Nwa nke madu, Nebukadreza, bú eze Babilon, mere ka usu-ndi-agha-ya fè òfùfè uku megide Taia: isi nile ọ bula ka emere isi-nkwọcha, ubu nile ọ bula ka echihiara echihia: ma ọ dighi ugwọ-ọlu ọ natara, ọ dighi kwa nke usu-ndi-agha-ya natara, n'aka Taia, n'ihi òfùfè ahu o fère megide ya.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, Ndi nka siri, Oge ibia erughi, bú oge iwu ulo Jehova.


Ma ndikom ahu ndi soro ya rigo siri, Ayi apughi irigo imegide ndi ahu, n'ihi na ndi di ike ka ha bu kari ayi.


Ha we rigorue ndagwurugwu Eshkol, hu ala ahu, we me ka obi umu Israel si, É-è, si na ha agaghi-abà n'ala ahu nke Jehova nyere ha-ri.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan