Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 3:30 - Bible Nso

30 N'iso ya ka Hananaia nwa Shelemaia, na Hanum, bú nwa nke-isi nke Zalaf, mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike. N'iso ya ka Meshulam nwa Berekaia mere ka mb͕idi di ike na ncherita-iru ime-ulo-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

30 Hananaya nwa Shelemaya na Hanun nwa Zalaf nke isii, wuziri akụkụ mgbidi nke ọzọ. Meshulam nwa Berekaya wuziri akụkụ mgbidi na-esota, bụkwa nke dị nʼihu ụlọ obibi ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 3:30
5 Iomraidhean Croise  

M'we me ndi-ulo-àkù ndi gāchi ulo-àkù nile, bú Shelemaia onye-nchu-àjà, na Zedok, bú ode-akwukwọ, na Pedaia, onye sitere na ndi Livai: Hanan nwa Zakua, nwa Matanaia, nọ kwa n'akuku ha: n'ihi na aguru ha na ndi kwesiri ntukwasi-obi, ọlu-ha bu kwa ikère umu-nne-ha òkè.


N'iso ha ka Zedok nwa Imea mere ka mb͕idi di ike na ncherita-iru ulo-ya. N'iso ya ka Shemaia nwa Shekania, bú onye nēche ọnu-uzọ-ama ọwuwa-anyanwu, mere ka mb͕idi di ike.


N'iso ya ka Malkija, bú otù onye nime ndi-nnucha-ọla, mere ka mb͕idi di ike rue ulo Netinim, na nke ndi nāzu ahia, na ncherita-iru ọnu-uzọ-ama Hamifkad, ru kwa nrigo ulo-elu nkuku.


N'akuku ha ka Meremot nwa Uraia, nwa Hakoz, mere ka mb͕idi di ike. N'akuku ha ka Meshulam nwa Berekaia, nwa Meshezabel, mere ka mb͕idi di ike. N'akuku ha ka Zedok nwa Beana mere ka mb͕idi di ike.


N'ihi na ọtutu madu di nime Juda ndi nwere iyi ha ṅuru ya, n'ihi na di nwa-nwayi Shekania nwa Ara ka ọ bu; Jehohanan nwa-ya lu-kwa-ra nwa-nwayi Meshulam nwa Berekaia na nwunye.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan