Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 3:1 - Bible Nso

1 Elaiashib, bú onye-isi-nchu-àjà, we bilie, ya na umu-nne-ya, bú ndi-nchu-àjà, ha we lua ọnu-uzọ-ama aturu; ha onwe-ha doro ya nsọ, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya; ọbuná rue ulo-elu Hamea ka ha doro ya nsọ, rue ulo-elu Hananel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Mgbe ahụ, Eliashib onyeisi nchụaja na ndị nchụaja ibe ya wuru mgbidi ahụ ruo nʼụlọ elu Narị na ụlọ elu Hananel. Ha wukwara Ọnụ Ụzọ ama Atụrụ, kwụba ibo ya, doo ya nsọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 3:1
19 Iomraidhean Croise  

Jeshua we mua Joiakim, Joiakim mua Elaiashib, Elaiashib mua Joiada,


Ndi-nchu-àjà na ndi Livai we me onwe-ha ka ha di ọcha: ha me-kwa-ra ka ndi Israel na ọnu-uzọ-ama nile na mb͕idi di ọcha.


site kwa n'akuku di n'elu n'ebe ọnu-uzọ-ama Efraim di, na n'akuku ọnu-uzọ-ama ochie, na n'akuku ọnu-uzọ-ama azù, na ulo-elu Hananel, na ulo-elu Hamea, we rue ọnu-uzọ-ama aturu: ha we guzo n'ọnu-uzọ-ama ulo-nche.


Ma otù nime umu-ndikom Joiada nwa Elaiashib, bú onye-isi-nchu-àjà, bu di nwa-nwayi Sanbalat onye Horonaim: m'we me ka ọ b͕apu n'ebe m'nọ.


Ma tutu ihe a eme, Elaiashib, bú onye-nchu-àjà, onye edoro onye-isi ime-ulo nke ulo Chineke-ayi, ebe ọ bu ọgọ Tobaia,


N'iso ya ka Beruk nwa Zabai nuru ọku n'obi ime iberibe ọzọ atùru atù di ike, site na nkuku mb͕idi rue ọnu-uzọ ulo Elaiashib, bú onye-isi-nchu-àjà.


N'iso ya ka Meremot nwa Uraia nwa Hakoz mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, site n'ọnu-uzọ ulo Elaiashib we rue nsọtu ulo Elaiashib.


N'etiti nrigo ulo-elu nkuku na ọnu-uzọ-ama aturu ka ndi-nnucha-ọla na ndi nāzu ahia mere ka ọ di ike.


O rue, mb͕e Sanbalat, na Tobaia, na Geshem, bú onye Arebia, na ndi-iro-ayi fọduru, nuru na m'lusiri mb͕idi ahu, na ọ dighi kwa ntipú fọduru nime ya; (ọ bu ezie na akaghm-eguzo ibo-ọnu-uzọ n'ọnu-uzọ-ama nile rue mb͕e ahu;)


O rue, mb͕e alusiri mb͕idi ahu, mb͕e m'guzosi-kwa-ra ibo-ọnu-uzọ-ya nile, mb͕e emesi-kwa-ra ndi-ọnu-uzọ-ama na ndi-ọbù-abù na ndi-Livai ka ha lekọta ozi-ha,


M'gēbuli Gi elu, Jehova; n'ihi na I dọgowom n'elu, I meghi kwa ka ndi-irom ṅuriam.


Jenu Zaion buruburu, b͕a kwa ya buruburu: Guanu ulo-elu-ya nile ọnu.


N'uzọ-gi nile mara Ya, Ya onwe-ya gēme kwa ka okporo-uzọ-gi nile zie ezi.


Sọpuru Jehova site n'àkù-gi, Site kwa na nkpuru mbu nke ihe-ọmume-gi nile:


Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e agēwuru Jehova obodo a site n'ulo-elu nke Hananel rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku.


Ma mara, were kwa uche mata, na site na nputa okwu ahu iwughachi na iwuzi Jerusalem rue mb͕e onye etere manu, bú onye-ndú, gādi ízù asa: na ọgu atọ na abua, agēwuzi kwa ya ọzọ, ya na amá na ékpè, ọbuná na nkpà nke mb͕e ndia.


Ala nka nile gāghọ ihe di ka Araba, site na Geba rue Rimon na Ndida Jerusalem: agēbuli kwa ya elu, ọ gēbi kwa n'ọnọdu-ya, site n'ọnu-uzọ-ama Benjamim rue ebe ọnu-uzọ-ama mbu, rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku, site kwa n'ulo-elu Hananel rue ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile nke eze.


Ma ọdọ-miri ntà di na Jerusalem n'akuku ọnu-uzọ-ama nke aturu, nke anākpọ n'asusu Hibru Betesda, nke nwere ulo-ìbà ise.


Ndi-ọchi-agha gāgwa ndi Israel okwu, si, Ònye bu nwoke nke wuworo ulo ọhu, ma ọ kāraghi ya nye Chineke? ya je laghachi n'ulo-ya, ka ọ ghara inwu n'agha, nwoke ọzọ ewe ra ya nye Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan