Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 13:5 - Bible Nso

5 ọ we doziere ya ime-ulo uku, ma n'ebe ahu ka ha nētiye na mb͕e gara aga onyinye-inata-iru-ọma, na frankincense, na ihe ulo Chineke nile, na otù uzọ n'uzọ iri nke ọka na manya-vine ọhu na manu, bú ihe enyere n'iwu nke ndi Livai na ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama; na àjà-nbuli nke ndi-nchu-aja.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 o weere otu ọnụụlọ buru ibu a na-achịkọba ihe nye ya. Na mbụ, ọ bụ ọnụụlọ ebe a na-achịkọta onyinye ọka na ụda na-esi isi ụtọ, na ngwongwo ụlọnsọ, na efere mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv. Mosis enyelarị ya nʼiwu na ọ bụ ndị Livayị na ndị ọbụ abụ na ndị nche nwe onyinye ndị ahụ. Ndị nchụaja nwekwa oke nʼihe ndị a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 13:5
9 Iomraidhean Croise  

Hezekaia we si ka edozie ime-ulo n'ulo Jehova; ha we dozie.


ha we nye ya ndi-ọ̀kà n'osisi, nye kwa ndi nēwu ulo, iji zuta nkume awara awa, na osisi iji me ihe-njikọta, na ijikọta ulo nile nke ndi-eze Juda bibiri.


na umu eburu uzọ mu nke umu-ayi ndikom na nke anu-ulo-ayi, dika edeworo ya n'iwu, na umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-ayi na nke ìgwè ewu na aturu-ayi, iwebata ha n'ulo Chineke-ayi, nye ndi-nchu-àjà ndi nēje ozi n'ulo Chineke-ayi:


na ayi gēwebata-kwa-ra ndi-nchu-àjà utu ọka mbu ayi, na àjà-nbuli nile ayi, na nkpuru nke osisi nile ọ bula, na manya-vine ọhu, na manu, rue ime-ulo nke ulo Chineke-ayi; webata-kwa-ra ndi Livai otù uzọ n'uzọ iri nke ihe ala-ubi-ayi; n'ihi na ha onwe-ha, bú ndi Livai, nānara otù uzọ n'uzọ iri n'obodo nile nke ọlu-ubi-ayi.


Onye-nchu-àjà, bú nwa Eron, gānọye-kwa-ra ndi Livai, mb͕e ndi Livai nānara otù uzọ n'uzọ iri: ndi Livai gēwegota kwa otù uzọ n'uzọ iri nime otù uzọ n'uzọ iri nile rue ulo Chineke-ayi, rue ime-ulo, rue ulo àkù.


Ewe me ndikom ufọdu n'ubọchi ahu ka ha buru ndi nēlekọta ime-ulo nile nke idebe àkù, na idebe àjà-nbuli nile, na ibede nkpuru mbu, na idebe otù uzọ n'uzọ iri nile, ichikọbata nime ha, dika ubi obodo nile si di, òkè nile nke iwu nyere ndi-nchu-àjà na ndi Livai: n'ihi na ọṅù Juda di n'ihi ndi-nchu-àjà na n'ihi ndi Livai, bú ndi nēguzo eguzo.


m'we biarue Jerusalem, ghọta ihe ọjọ ahu nke Elaiashib mere bayere Tobaia, n'idoziri ya ime-ulo n'ogige ulo Chineke.


Otù ime-ulo na ọnu-uzọ-ya di kwa n'akuku-ọnu-uzọ n'ọnu-uzọ-ama nile; n'ebe ahu ka ha nāsacha anu àjà-nsure-ọku.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan