Nehemaya 13:21 - Bible Nso21 M'we b͕a àmà megide ha, si ha, Gini mere unu onwe-unu nānọ ọnọdu-abali na ncherita-iru mb͕idi? ọ buru na unu eme ya ọzọ, m'gēseti aka megide unu. Site na mb͕e ahu ha abiaghi n'ubọchi-izu-ike. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a21 Ma a dọrọ ha aka na ntị, sị, “Gịnị ka unu ji na-anọ ọnọdụ abalị nʼakụkụ mgbidi a? Ọ bụrụ na unu eme ya ọzọ, aga m enye iwu ka e jide unu.” Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ha abịakwaghị ọzọ nʼụbọchị izuike. Faic an caibideil |
Na mb͕e ahu ka m'huru nime Juda ufọdu ndi nāzọcha ebe-nzọcha-nkpuru-vine n'ubọchi-izu-ike, ndi nēbubata kwa obo ọka, nēbo kwa inyinya-ibu; ọzọ kwa, manya-vine, na nkpuru-vine, na fig, na ibu nile ọ bula, ha nēbubata kwa ha nime Jerusalem n'ubọchi-izu-ike: m'we b͕a àmà megide ha n'ubọchi ha nēre ihe-oriri.