Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 13:13 - Bible Nso

13 M'we me ndi-ulo-àkù ndi gāchi ulo-àkù nile, bú Shelemaia onye-nchu-àjà, na Zedok, bú ode-akwukwọ, na Pedaia, onye sitere na ndi Livai: Hanan nwa Zakua, nwa Matanaia, nọ kwa n'akuku ha: n'ihi na aguru ha na ndi kwesiri ntukwasi-obi, ọlu-ha bu kwa ikère umu-nne-ha òkè.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 E tinyere m Shelemaya onye nchụaja, na Zadọk ode akwụkwọ, na Pedaia onye Livayị, ka ha bụrụ ndị na-elekọta ụlọ ịchịkọba ihe niile ahụ. Emekwara m Hanan nwa Zakua, nwa Matanaya, onye ga na-enyere ha aka, nʼihi na a gụrụ ha dịka ndị kwesiri ntụkwasị obi. Ọrụ ha bụ ikere ndị Livayị ibe ha niile oke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 13:13
20 Iomraidhean Croise  

Ha na ndikom ahu, ndi ha nēnye ego n'aka-ha inye ndi n'eje ozi ahu, agughi ego ahu: n'ihi na ọ bu n'ikwesi-ntukwasi-obí ka ndi ahu nēme ihe.


Adighi-ewebata ego àjà-ikpe-ọmuma na ego àjà-nmehie n'ulo Jehova: ọ bu ndi-nchu-àjà nwe ya.


Nání na ha na ndi ahu agughi ego nke anēnye n'aka-ha; n'ihi na ọ bu n'ikwesi-ntukwasi-obi ka ndi ahu nēme ihe.


na Zakua, na Sherebia, na Shebania;


Onye-nchu-àjà, bú nwa Eron, gānọye-kwa-ra ndi Livai, mb͕e ndi Livai nānara otù uzọ n'uzọ iri: ndi Livai gēwegota kwa otù uzọ n'uzọ iri nime otù uzọ n'uzọ iri nile rue ulo Chineke-ayi, rue ime-ulo, rue ulo àkù.


Ma onye-nlekọta ndi Livai nime Jerusalem bu Uzi nwa Bani, nwa Hashabaia, nwa Matanaia, nwa Maika, sitere n'umu Esaf, bú ndi-ọbù-abù, onye nēle ije-ozi nke ulo Chineke anya.


na ufọdu nime umu nke ndi-nchu-àjà, ndi chiri opì: na Zekarai nwa Jonatan, nwa Shemaia, nwa Matanaia, nwa Maikaia, nwa Zakua, nwa Esaf;


Ewe me ndikom ufọdu n'ubọchi ahu ka ha buru ndi nēlekọta ime-ulo nile nke idebe àkù, na idebe àjà-nbuli nile, na ibede nkpuru mbu, na idebe otù uzọ n'uzọ iri nile, ichikọbata nime ha, dika ubi obodo nile si di, òkè nile nke iwu nyere ndi-nchu-àjà na ndi Livai: n'ihi na ọṅù Juda di n'ihi ndi-nchu-àjà na n'ihi ndi Livai, bú ndi nēguzo eguzo.


N'iso ya ka Hananaia nwa Shelemaia, na Hanum, bú nwa nke-isi nke Zalaf, mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike. N'iso ya ka Meshulam nwa Berekaia mere ka mb͕idi di ike na ncherita-iru ime-ulo-ya.


na m'nyere Hanani, bú nwa-nnem, na Hananaia, bú onye-isi ulo uku eze, iwu bayere Jerusalem: n'ihi na onye ahu bu onye ezi-okwu, ọ nātu kwa egwu Chineke kari ọtutu madu.


Ezra, bú ode-akwukwọ, we guzo n'elu ulo-elu osisi, nke ha mere bayere ihe a; Matitaia, na Shema, na Anaia, na Uraia, na Hilkaia, na Maaseia, we guzo n'akuku ya, n'aka-nri-ya; Pedaia kwa, na Mishael, na Malkija, na Hashum, na Hashbadana, na Zekaraia, na Meshulam, n'aka-ekpe-ya.


Onye-nwe-ayi we si, Ònye kwa bu onye ahu nāchi èzí-na-ulo, onye kwesiri ka atukwasi ya obi, nke nwe-kwa-ra uche, nke onye-nwe-ya gēme onye-isi èzí-na-ulo-ya, inye ha òkè nri ha n'oge-ya?


tọb͕ọ ha n'ukwu ndi-ozi: ewe nēkè òkè enye ha nile n'otù n'otù, dika ọ di onye ọ bula nkpà.


Ma na mb͕e ahu, mb͕e ndi nēso uzọ Jisus nāba uba, ndi-Ju nāsu asusu Grik malitere itamu megide ndi-Hibru, n'ihi na elefuru ndinyom-ha ndi di-ha nwuru anya n'ije-ozi, bú ikère ndi Kraist òkè, kwa-ubọchi.


Kama, umu-nna-ayi, chọputanu n'etiti unu ndikom asa ndi ab͕ara ha ezi àmà, ndi juputara na Mọ Nsọ na amam-ihe, ndi ayi gēme ndi-isi n'ọlu a di nkpà.


N'ebe a ihe anāchọ kwa n'aka ndi nāchi èzí-na-ulo bu, ka ahu onye ọ bula na o kwesiri ntukwasi-obi.


Anamekele Onye ahu Nke merem ka m'di ike, bú Kraist Jisus Onye-nwe-ayi, n'ihi na Ọ gurum n'onye kwesiri ntukwasi-obi, ebe O deberem ijere Ya ozi;


Ma ka eburu uzọ nwa kwa ndia; mb͕e ahu ka ha jebe ozi, ma ọ buru na ha bu ndi anāpughi ibo ebubo.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan