Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 13:12 - Bible Nso

12 Juda nile we webata otù uzọ n'uzọ iri nke ọka na manya-vine ọhu na manu n'ulo-àkù.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ndị Juda niile bidokwara iweta ụtụ ha, na onyinye ọka, na mmanya vaịnị na mmanụ oliv ha nʼụlọ ịchịkọba ihe dị nʼụlọnsọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 13:12
9 Iomraidhean Croise  

O we si ndi Juda, bú ndi bi na Jerusalem, ka ha nye òkè ndi-nchu-àjà na ndi Livai, ka ha we di ike n'iwu Jehova.


Ma mb͕e ekwusara okwu ahu, umu Israel nyere nkpuru mbu nke ọka, na nke manya-vine ọhu, na nke manu, na nke manu-aṅu, na nke ihe-ọmume nile nke ubi, n'uba; otù uzọ n'uzọ iri nke ihe nile ka ha bubatara n'uba.


Ewe me ndikom ufọdu n'ubọchi ahu ka ha buru ndi nēlekọta ime-ulo nile nke idebe àkù, na idebe àjà-nbuli nile, na ibede nkpuru mbu, na idebe otù uzọ n'uzọ iri nile, ichikọbata nime ha, dika ubi obodo nile si di, òkè nile nke iwu nyere ndi-nchu-àjà na ndi Livai: n'ihi na ọṅù Juda di n'ihi ndi-nchu-àjà na n'ihi ndi Livai, bú ndi nēguzo eguzo.


Otù uzọ n'uzọ iri ihe nile nke ala, site na nkpuru-ọghigha nke ala, ma ọbu site na nkpuru osisi, ihe Jehova nwere ka ọ bu: ọ bu ihe nsọ diri Jehova.


Webatanu otù uzọ n'uzọ iri nile n'ulo-àkù nkem, ka ihe-oriri we di n'ulom, biko, nwanum na nka, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, ma M'gaghi-emeghere unu window nile nke elu-igwe, wusara unu ngọzi, rue mḅe ọnọdu agaghi-ezu inagide ya.


Madu, ọ̀ gāpunara Chineke ihe? ma unu nāpunaram ihe. Ma unu nāsi, Nìme gini ka ayi punaraworo Gi ihe? N'otù uzọ n'uzọ iri nile na àjà-nbuli nile.


I ghaghi inye otù uzọ n'uzọ iri nke ihe-ọmume nile nke nkpuru-gi, bú ihe nke nēsi n'ubi-gi puta kwa-arọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan