9 Bakbukia na Uno, bú umu-nne-ha, nọ kwa na ncherita-iru ha, dika ihe-ndebe nile ha si di.
9 Bakbukaya, na Unni, ndị otu ha nọ na ncherita ihu nʼofufe ahụ.
Jeshua we mua Joiakim, Joiakim mua Elaiashib, Elaiashib mua Joiada,
Ndi-isi ndi Livai kwa: Hashabaia, na Sherebia, na Jeshua nwa Kadimiel, na umu-nne-ha ndi nọ na ncherita-iru ha, ito Chineke na ikele ekele, dika ihe Devid, bú onye nke Chineke, nyere n'iwu si di, otù ihe-ndebe nēcherita ihe-ndebe ọzọ iru.
Ndi Livai kwa: Jeshua, na Binui, na Kadmiel, na Sherebia, na Juda, na Matanaia, bú onye-isi usu ndi nēkele ekele, ya onwe-ya na umu-nne-ya.