Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 12:45 - Bible Nso

45 Ha we debe ihe-ndebe Chineke-ha, na ihe-ndebe ime-ka-adi-ọcha ahu, ha na ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama, dika ihe Devid na Solomon nwa-ya nyere n'iwu si di.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

45 Nʼihi na ha na-arụ ọrụ Chineke ahụ ha ketara ịrụ, ya na ọrụ ido ndị mmadụ na ihe ọbụla nsọ. Otu a kwa ka ndị ọbụ abụ, na ndị na-eche nche sị arụkwa ọrụ a dịka iwu Devid na Solomọn nwa ya nyere si dị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 12:45
5 Iomraidhean Croise  

Ha we bia, kpọ onye-ọnu-uzọ-ama obodo òkù, gosi ha, si, Ayi bara n'ọmuma-ulo-ikwū Siria, ma, le, ọ dighi nwoke nọ n'ebe ahu, ọ dighi kwa olu madu di, ma inyinya elibere elibe, na inyinya-ibu elibere elibe, na ulo-ikwū otú ha di.


N'ihi na ebe-nguzo-ha di n'akuku umu Eron ifè òfùfè ulo Jehova, n'ogige nile, na n'ime-ulo nile, na n'ime ka ihe nsọ ọ bula di ọcha, bú ọlu òfùfè ulo Chineke;


Shelomot nka na umu-nne-ya bu ndi-isi ulo-àkù nile nke ihe nsọ nile nke Devid, bú eze, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna, bú ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri na usu ọgu ndikom ise, na ndi-isi usu-ndi-agha, doro nsọ.


Ma ka onye ọ bula ghara ibà n'ulo Jehova, ọ bu nání ndi-nchu-àjà, na ndi n'etiti ndi Livai ndi nēje ozi; ndi ahu gābà, n'ihi na ndi nsọ ka ha bu: ma ndi Juda nile gēdebe ihe-ndebe ulo Jehova.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan