Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 12:39 - Bible Nso

39 site kwa n'akuku di n'elu n'ebe ọnu-uzọ-ama Efraim di, na n'akuku ọnu-uzọ-ama ochie, na n'akuku ọnu-uzọ-ama azù, na ulo-elu Hananel, na ulo-elu Hamea, we rue ọnu-uzọ-ama aturu: ha we guzo n'ọnu-uzọ-ama ulo-nche.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

39 Anyị sitekwara nʼebe ahụ gafee Ọnụ Ụzọ Ama Ifrem, Ọnụ Ụzọ ama Jeshana, Ọnụ Ụzọ Ama Azụ, Ọnụ Ụzọ Ama Ụlọ Elu Hananel, ruokwa nʼỌnụ Ụzọ Ama Ụlọ Elu Narị na ruo nʼỌnụ Ụzọ Ama Atụrụ, kwụsị nʼỌnụ Ụzọ Ama Ndị Nche.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 12:39
12 Iomraidhean Croise  

Jehoash, bú eze Israel, we jide Amazaia, bú eze Juda, nwa Jehoash nwa Ehazaia, nime Bet-shemesh, we biarue Jerusalem, tipue mb͕idi Jerusalem site n'ọnu-uzọ-ama Efraim rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku, nnù cubit.


Usu abua ahu nke ndi nēkele ekele we guzo n'ulo Chineke, ha na mu onwem, nkera ndi nọchiri anya eze nọye-kwa-ram:


Elaiashib, bú onye-isi-nchu-àjà, we bilie, ya na umu-nne-ya, bú ndi-nchu-àjà, ha we lua ọnu-uzọ-ama aturu; ha onwe-ha doro ya nsọ, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya; ọbuná rue ulo-elu Hamea ka ha doro ya nsọ, rue ulo-elu Hananel.


Palal nwa Uzai mere ka mb͕idi di ike site na ncherita-iru nkuku mb͕idi, na ulo-elu nke nāputa n'ulo di n'elu nke eze, bú nke di nso ogige ulo-nche. N'iso ya ka Pedaia nwa Parosh mere ka mb͕idi di ike.


Ọnu-uzọ-ama azù ka umu Hasenaa luru; ndi ahu jikọtara ya n'otù, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile.


Ọnu-uzọ-ama ochie ka Joiada nwa Pasea na Meshulam nwa Besodeia mere ka ọ di ike; ndi ahu jikọtara ya n'otù, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile.


Ndi ahu we je, chita ha, mere onwe-ha ulo-ntu, nwoke ọ bula n'elu-ulo-ya, na n'ogige nile ha, na n'ogige nile nke ulo Chineke, na n'amá nke ọnu-uzọ-ama miri, na n'amá nke ọnu-uzọ-ama Efraim.


Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e agēwuru Jehova obodo a site n'ulo-elu nke Hananel rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku.


Ma mb͕e ahu usu-ndi-agha eze Babilon nānọchigide Jerusalem n'agha: ma Jeremaia, bú onye-amuma, nọ ka onye eb͕ochibidoworo n'ogige ulo-nche, nke di n'ulo eze Juda.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na olu iti-nkpu gēsi n'ọnu-uzọ-ama azù da, ya na ikwasi-ákwá-ike site n'obodo nke-abua, na oké ntiwa site n'ugwu ntà nile.


Ma ọdọ-miri ntà di na Jerusalem n'akuku ọnu-uzọ-ama nke aturu, nke anākpọ n'asusu Hibru Betesda, nke nwere ulo-ìbà ise.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan