Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 12:37 - Bible Nso

37 ha we rigo n'akuku ọnu-uzọ-ama isi-iyi, na ncherita-iru ha kwa, n'elu ihe-nrigo obodo Devid, nime nrigo mb͕idi, site n'akuku di n'elu n'ebe ulo Devid di, we rue ọnu-uzọ-ama miri n'akuku ọwuwa-anyanwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

37 Mgbe ha rutere nʼỌnụ Ụzọ ama Isi Iyi, ha rigooro nʼelu nkwasa nrigo ụlọ elu e si abata nʼobodo Devid, si ebe ahụ gafee ụlọeze Devid, gaakwa lọghachi nʼỌnụ Ụzọ Ama Mmiri, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 12:37
7 Iomraidhean Croise  

M'we gabiga rue ọnu-uzọ-ama isi-iyi, ru kwa ọdọ-miri eze: ọ dighi kwa ebe anu-ulo nke di n'okpurum gāgabiga.


(Ma Netinim nēbi n'Ofel, rue na ncherita-iru ọnu-uzọ-ama miri n'akuku ọwuwa-anyanwu, na ulo-elu nke nāputa aputa.)


Ndi ahu nile we chikọta onwe-ha dika otù onye rue amá nke di n'iru ọnu-uzọ-ama miri; ha we si Ezra, bú ode-akwukwọ, ka o weta akwukwọ iwu Moses, nke Jehova nyere Israel n'iwu.


Ndi ahu we je, chita ha, mere onwe-ha ulo-ntu, nwoke ọ bula n'elu-ulo-ya, na n'ogige nile ha, na n'ogige nile nke ulo Chineke, na n'amá nke ọnu-uzọ-ama miri, na n'amá nke ọnu-uzọ-ama Efraim.


O we gua nime ya n'iru amá nke di n'iru ọnu-uzọ-ama miri site oge ututu rue etiti-ehihie, n'iru ndikom na ndinyom na ndi nāghọta ihe; ndi ahu nile we ṅa nti akwukwọ iwu ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan