Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 12:35 - Bible Nso

35 na ufọdu nime umu nke ndi-nchu-àjà, ndi chiri opì: na Zekarai nwa Jonatan, nwa Shemaia, nwa Matanaia, nwa Maikaia, nwa Zakua, nwa Esaf;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

35 na ndị nchụaja ndị a ndị na-afụ opi, tinyere Zekaraya nwa Jonatan, nwa Shemaya. Ndị bụ nna nna Zekaraya bụ Matanaya, Mikaya na Zakua, ndị ikwu Asaf.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 12:35
10 Iomraidhean Croise  

nke umu ndikom Esaf; Zakua, na Josef, na Netanaia, na Asharela, bú umu Esaf; ha nọ n'aka Esaf, onye nēbu amuma n'aka eze.


Ma, le, Chineke nọyere ayi, dika onye-isi-ayi, Ya na ndi-nchu-àjà-Ya, ndi chiri opì ahu, bú nke eji fù ka ha we dasie udà ike, ifù ha ka ha we dasie uda ike megide unu. Umu Israel, unu ebusola Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, agha; n'ihi na ọ gaghi-agara unu nke-ọma.


ọzọ, ndi Livai, bú ndi-ọbù-abù, ọbuná ha nile, bú Esaf na Himan, na Jedutun, na umu-ha ndikom, na umu-nne-ha, nēguzo kwa n'akuku ọwuwa-anyanwu nke ebe-ichu-àjà ahu, yiri ezi ákwà ọcha, chiri kwa ájà na une na ubọ-akwara, ọgu ndi-nchu-àjà isi ndi nāfù opi so-kwa-ra ha:)


na Matanaia nwa Maika, nwa Zabdi, nwa Esaf, onye bu isi nāmalite ikele ekele n'ekpere, na Bakbukia, bú onye nke-abua n'umu-nne-ya; na Abda nwa Shamua, nwa Galal, nwa Jedutun.


na Juda, na Benjamin, na Shemaia, na Jeremaia,


na umu-nne-ya, bú Shemaia, na Azarel, na Milalai, na Gilalai, na Maai, na Netanel, na Juda, na Hanani, ndi chiri ihe abù nke Devid, bú onye nke Chineke; Ezra, bú ode-akwukwọ, nọ kwa n'iru ha:


Ndi-nchu-aja asa gēbu kwa opì-ike oké uda asa n'iru ib͕e ahu: ma n'ubọchi nke-asa unu gāb͕a obodo ahu buruburu ub͕ù asa, ndi-nchu-aja gāfù kwa opì-ike asa ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan