Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 12:31 - Bible Nso

31 M'we me ka ndi-isi Juda rigo n'elu mb͕idi, m'we guzo oké usu abua nke ndi nēkele ekele nēje kwa n'usoro; otù usu we je n'aka-nri n'elu mb͕idi rue ọnu-uzọ-ama nke ebe ikpofu ahihia:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

31 E mere m ka ndị ndu Juda niile rigoro nʼelu mgbidi ahụ. Nʼebe ahụ ka m kenyere otu ndị ọbụ abụ abụọ inye ekele. Otu ụzọ gara akụkụ aka nri nke elu mgbidi ahụ ruo nʼỌnụ Ụzọ Ama Ikpofu Ahịhịa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 12:31
8 Iomraidhean Croise  

Devid we me ka ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na usu nile nke ọgu ndikom ise dua ya ọdu, bú onye-ndú ọ bula.


Devid we kpọkọta ndi-isi nile nke Israel, bú ndi-isi ebo nile, na ndi-isi òkè nile ndi nējere eze ozi, na ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, na ndi-isi àkù na anu-ulo nile eze nwere, na nke umu-ya ndikom nwere, ha na ndi-onozi, na ndi-dike, ọbuná dike ọ bula nke bu dìnkpà, rue Jerusalem.


Mb͕e ahu Solomon kpọkọtara ndi-okenye Israel, na ndi-isi nile nke ebo nile ha, bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna umu Israel, ibiaru Jerusalem, isi n'obodo Devid, nke ahu bu Zaion, bugota ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova.


Hoshaia we jeso ha, ya na nkera ndi-isi Juda,


Usu nke-abua nke ndi nēkele ekele nke nēje izute ha je-kwa-ra, mu onwem so-kwa-ra ha je, mu na nkera ndi-ayi, n'elu mb͕idi, site n'akuku di n'elu n'ebe ulo-elu nke ite-ọku uku di, we rue mb͕idi sara mbara;


Usu abua ahu nke ndi nēkele ekele we guzo n'ulo Chineke, ha na mu onwem, nkera ndi nọchiri anya eze nọye-kwa-ram:


M'we si n'ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu pua n'abali, we rue n'iru isi-iyi dragon, ru kwa ọnu-uzọ-ama ebe ikpofu ahihia, we le mb͕idi Jerusalem nile anya, bú nke etipúsiri etipú, ọku eripiawo kwa ọnu-uzọ-ama-ya nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan