Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 12:25 - Bible Nso

25 Matanaia na Bakbukia na Obadia na Meshulam na Talmon na Akub bu ndi-ọnu-uzọ-ama nēdebe ihe-ndebe-ha n'ulo-nchikọbata-ihe nile nke ọnu-uzọ-ama nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Ndị nche na-eche ọnụ ụzọ ụlọ ịchịkọba ihe nke ụlọnsọ bụ ndị a: Matanaya, Bakbukaya, Ọbadaya, Meshulam, Talmon na Akub.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 12:25
10 Iomraidhean Croise  

Ha we bia, kpọ onye-ọnu-uzọ-ama obodo òkù, gosi ha, si, Ayi bara n'ọmuma-ulo-ikwū Siria, ma, le, ọ dighi nwoke nọ n'ebe ahu, ọ dighi kwa olu madu di, ma inyinya elibere elibe, na inyinya-ibu elibere elibe, na ulo-ikwū otú ha di.


ka ha we debe kwa ihe-ndebe ulo-ikwū nzute, na ihe-ndebe ebe nsọ ahu, na ihe-ndebe umu Eron, bú umu-nne-ha, bayere òfùfè ulo Jehova.


Nke ndia ka òkè nile nke ndi-ọnu-uzọ-ama bu, bú nke ndi-isi nke ndi di ike nwere ihe-ndebe ọbuná dika umu-nne-ha, ije ozi n'ulo Jehova.


Ife-nzà nke Obed-edom putara n'akuku Ndida; nke umu-ya ndikom puta-kwa-ra n'ulo nchikọta-ihe.


Ndi Livai isi nọ n'akuku ọwuwa-anyanwu, n'akuku Ugwu ha di anọ kwa-ubọchi, n'akuku Ndida ha di anọ kwa-ubọchi, ha di-kwa-ra ulo nchikọbata-ihe abua abua kwa-ubọchi.


Dika ikpé Devid, bú nna-ya, si di, o we guzo òkè nile nke ndi-nchu-àjà bayere òfùfè-ha, na ndi Livai bayere ihe-ndebe nile ha, ito Chineke, na ije ozi n'iru ndi-nchu-àjà, ime ihe ubọchi n'ubọchi-ya: o guzo-kwa-ra ndi-ọnu-uzọ-ama n'òkè nile ha n'ọnu-uzọ-ama ọ bula: n'ihi na otú a ka ihe si di nke Devid, bú onye nke Chineke, nyere n'iwu.


O we kpọ dika ọdum: si, Onye-nwe-ayi, n'elu ulo-nche ka mu onwem nēguzo mb͕e nile n'ehihie, na nchem ka anēme ka mu onwem guzo n'abali nile:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan