36 Site kwa na ndi Livai òkè ufọdu nke Juda diri Benjamin.
36 Ụfọdụ nʼotu ndị Livayị, ndị ebe obibi ha dị na Juda ka e zigara isoro biri nʼebo Benjamin.
Ihe anābu ọnu ka iwe-ha bu, n'ihi na ọ di ike; Ọnuma-ha bu kwa ihe anābu ọnu, n'ihi na o sika ike: M'gēkesa ha nime Jekob, B͕asa kwa ha n'Israel.
na Lod, na Ono, bú ndagwurugwu ndi-ọ̀kà.
Ma ndia bu ndi-nchu-aja na ndi Livai ndi soro Zerubabel nwa Shealtiel, na Jeshua, rigota: Seraia, na Jeremaia, na Ezra;