21 Ma Netinim bi n'Ofel: Ziha na Gishpa bu kwa ndi-isi Netinim.
21 Ndị ahụ niile na-eje ozi nʼụlọnsọ bi nʼugwu Ofel. Ndịisi ha bụ Ziha na Gishpa.
Ma ndi-obibi mbu ndi bi n'ihe-onwunwe-ha n'obodo nile ha bu, Israel, ndi-nchu-aja, ndi Livai, na Netinim.
Onye ahu wuru ọnu-uzọ-ama ulo Jehova nke di n'elu, o wu-kwa-ra ulo n'uba n'elu mb͕idi Ofel.
Netinim: umu Ziha, na umu Hasufa, na umu Tabaot;
(Ma Netinim nēbi n'Ofel, rue na ncherita-iru ọnu-uzọ-ama miri n'akuku ọwuwa-anyanwu, na ulo-elu nke nāputa aputa.)
N'iso ya ka Malkija, bú otù onye nime ndi-nnucha-ọla, mere ka mb͕idi di ike rue ulo Netinim, na nke ndi nāzu ahia, na ncherita-iru ọnu-uzọ-ama Hamifkad, ru kwa nrigo ulo-elu nkuku.