Ndi-isi ndi-Ju we biri na Jerusalem: ndi-Ju fọduru fe-kwa-ra nzà, ime ka otù onye nime madu iri bata ibi na Jerusalem, bú obodo nsọ, ka uzọ iteghete ndi fọduru biri kwa n'obodo ọzọ.
na Matanaia nwa Maika, nwa Zabdi, nwa Esaf, onye bu isi nāmalite ikele ekele n'ekpere, na Bakbukia, bú onye nke-abua n'umu-nne-ya; na Abda nwa Shamua, nwa Galal, nwa Jedutun.
Ọgu ízù atọ na iri, bú ízù ubọchi asa, ka ekpeworo n'ikpe bayere ndi-gi, baye-kwa-ra obodo nsọ gi, ime ka njehie bìe, na ime ka nmehie gwusia, na ikpuchi ajọ omume, na ime ka ezi omume ebighi-ebi bata, na ikachita ọhù na omuma akàrà, na ite Onye nsọ ahu Nke kachasi ndi nsọ nile manu.
Ya mere, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu, nke ekwuru site n'ọnu Daniel onye-amuma, ka ọ nēguzo n'ebe nsọ unu (onye nāgu, ya tugharia uche),
M'we hu obodo nsọ ahu, bú Jesusalem ọhu, ka ọ nēsi n'elu-igwe ridata, site n'ebe Chineke nọ, edoziwo ya dika nwanyi anālu ọhu nke achọworo ya nma nye di-ya.