Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 11:17 - Bible Nso

17 na Matanaia nwa Maika, nwa Zabdi, nwa Esaf, onye bu isi nāmalite ikele ekele n'ekpere, na Bakbukia, bú onye nke-abua n'umu-nne-ya; na Abda nwa Shamua, nwa Galal, nwa Jedutun.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Matanaya nwa Mika, nwa Zabdi, nwa Asaf, bụ onyendu nke duru nʼekpere na ofufe ekele. Bakbukaya onye nke abụọ nʼetiti ndị otu ya, na Abda nwa Shamua, nwa Galal, nwa Jedutun, bụ ndị na-enyere ya aka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 11:17
15 Iomraidhean Croise  

Mefiboshet nwe-kwa-ra otù nwatakiri-nwoke, aha-ya bu Maika. Ma ndi nile ndi bi n'ulo Ziba buru Mefiboshet ndi-orù.


O we tiye ufọdu nime ndi Livai n'iru ib͕e Jehova, bú ndi nēje ozi, ọbuná ime ka echeta na ikele na ito Jehova, bú Chineke Israel:


ha na Himan na Jedutun, na ndi fọduru nime ndi arọputara arọputa, ndi akpọrọ n'aha n'aha, ikele Jehova, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di;


na Bakbaka, na Heresh, na Galal, na Matanaia nwa Maika, nwa Zikri, nwa Esaf;


na Zakua, na Sherebia, na Shebania;


na Shabetai, na Jozabad, ndi sitere na ndi-isi ndi Livai, ndi bu ndi-isi nke ije-ozi nke èzí diri ulo Chineke;


Ndi Livai nile n'obodo nsọ ahu di ọgu iri-na-anọ na anọ.


Ndi-isi ndi Livai kwa: Hashabaia, na Sherebia, na Jeshua nwa Kadimiel, na umu-nne-ha ndi nọ na ncherita-iru ha, ito Chineke na ikele ekele, dika ihe Devid, bú onye nke Chineke, nyere n'iwu si di, otù ihe-ndebe nēcherita ihe-ndebe ọzọ iru.


Matanaia na Bakbukia na Obadia na Meshulam na Talmon na Akub bu ndi-ọnu-uzọ-ama nēdebe ihe-ndebe-ha n'ulo-nchikọbata-ihe nile nke ọnu-uzọ-ama nile.


M'we me ka ndi-isi Juda rigo n'elu mb͕idi, m'we guzo oké usu abua nke ndi nēkele ekele nēje kwa n'usoro; otù usu we je n'aka-nri n'elu mb͕idi rue ọnu-uzọ-ama nke ebe ikpofu ahihia:


N'ihi na n'ubọchi Devid na Esaf site na mb͕e ochie onye-isi nke ndi-ọbù-abù di, na abù otuto na ikele-ekele nke anābùku Chineke.


Unu echeb͕ula onwe-unu n'ihe ọ bula; kama n'ihe nile ọ bula site n'ekpere na aririọ, ya na ekele, menu ka Chineke mara ihe nile unu nāriọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan