Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 10:39 - Bible Nso

39 N'ihi na umu Israel na umu Livai gēwebata àjà-nbuli nke ọka na manya-vine ọhu na manu n'ime-ulo, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ihe nile nke ebe nsọ di, ha na ndi-nchu-àjà ndi nēje ozi, na ndi-ọnu-uzọ-ama, na ndi-ọbù-abù: ayi agaghi-arapu kwa ulo Chineke-ayi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

39 Ndị Izrel na ndị Livayị, kwesiri iweta onyinye ọka ha, na mmanya vaịnị ọhụrụ, na mmanụ oliv nʼime ụlọ ịchịkọba ihe, nʼebe a na-edebe ngwongwo niile e ji eje ozi nʼụlọ ukwu ahụ, nke ndị nchụaja na-eje ozi, ndị nche na nke ndị ọbụ abụ. “Anyị agaghị agbakụtakwa ụlọ Chineke anyị azụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 10:39
12 Iomraidhean Croise  

Ha we bia, kpọ onye-ọnu-uzọ-ama obodo òkù, gosi ha, si, Ayi bara n'ọmuma-ulo-ikwū Siria, ma, le, ọ dighi nwoke nọ n'ebe ahu, ọ dighi kwa olu madu di, ma inyinya elibere elibe, na inyinya-ibu elibere elibe, na ulo-ikwū otú ha di.


Hezekaia we si ka edozie ime-ulo n'ulo Jehova; ha we dozie.


Ha we bubata àjà-nbuli, na otù uzọ n'uzọ iri, na ihe nsọ nile, n'ikwesi-ntukwasi-obi: ma otù onye-ndú nāchi ha bu Konanaia onye Livai, Shimai nwa-nne-ya bu kwa nke-abua.


Israel nile n'ubọchi Zerubabel, na n'ubọchi Nehemaia, nēnye kwa òkè nke ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama, ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya: ha nēdo-kwa-ra ndi Livai ihe nsọ; ndi Livai nēdo-kwa-ra umu Eron ihe nsọ.


N'ihi ulo Jehova, bú Chineke-ayi, M'gāchọrọ gi ọdi-nma.


I gāgwa kwa ndi Livai okwu, si ha, Mb͕e unu nānara n'aka umu Israel otù uzọ n'uzọ iri nke M'nyeworo unu site n'aka-ha, dika ihe-nketa-unu, unu gēsi kwa na ya bulie àjà-nbuli nke Jehova, bú otù uzọ n'uzọ iri nke si n'otù uzọ n'uzọ iri ahu puta.


I gāsi kwa ha, Mb͕e unu nēsi na ya bulie ihe-ya kachasi nma, agāgu-kwa-ra ndi Livai ya dika ihe-ọmume nke ebe-nzọcha-ọka, na dika ihe-ọmume nke ebe-nzọcha-nkpuru-vine.


I pughi iri n'ọnu-uzọ-ama-gi nile otù uzọ n'uzọ iri nke ọka-gi, na nke manya-vine ọhu gi, na nke manu-gi, ma-ọbu umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-gi na nke ìgwè ewu na aturu-gi, ma-ọbu ihe ọ bula nke nkwa-gi nile nke i nēkwe, ma-ọbu onyinye-afọ-ofufo-gi nile, ma-ọbu àjà-nbuli nke aka-gi:


ka ayi ghara kwa irapu nzukọ nke onwe-ayi, dika ufọdu nēme, kama ka ayi nādusi ndi ọzọ ọdu ike; ka ayi me kari kwa otú a, n'uzọ ra otú unu nēle ubọchi ahu anya ka ọ nābiaru nso.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan