Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 10:37 - Bible Nso

37 na ayi gēwebata-kwa-ra ndi-nchu-àjà utu ọka mbu ayi, na àjà-nbuli nile ayi, na nkpuru nke osisi nile ọ bula, na manya-vine ọhu, na manu, rue ime-ulo nke ulo Chineke-ayi; webata-kwa-ra ndi Livai otù uzọ n'uzọ iri nke ihe ala-ubi-ayi; n'ihi na ha onwe-ha, bú ndi Livai, nānara otù uzọ n'uzọ iri n'obodo nile nke ọlu-ubi-ayi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

37 “Karịsịa, anyị ga-ewebata nʼụlọ ịchịkọba ihe nke ụlọnsọ Chineke anyị, nyekwa ha ndị nchụaja, ụtụ ọka mbụ anyị kwọrọ, ya na onyinye ndị ọzọ nke mkpụrụ ubi mbụ anyị, dịka mmanya vaịnị mbụ, mmanụ oliv mbụ na mkpụrụ osisi ndị ọzọ. Anyị kpebikwara inye ndị Livayị otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile anyị nwetara nʼubi anyị, nʼihi na ọ bụ ọrụ ndị Livayị ịnakọta otu ụzọ nʼụzọ iri site nʼobodo niile ebe anyị na-arụ ọrụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 10:37
23 Iomraidhean Croise  

Umu Israel na Juda, ndi bi n'obodo Juda nile, ndi ahu bubata-kwa-ra otù uzọ n'uzọ iri nke ìgwè ehi na ìgwè ewu na aturu, na otù uzọ n'uzọ iri nke ihe nsọ nke edoro nsọ nye Jehova, bú Chineke-ha, ha we tinye aha n'obo n'obo.


M'we mata na enyeghi òkè ndi Livai enye; ndi Livai na ndi-ọbù-abù, bú ndi nēje ozi ahu, we b͕alaga, nwoke ọ bula n'ubi-ya.


Juda nile we webata otù uzọ n'uzọ iri nke ọka na manya-vine ọhu na manu n'ulo-àkù.


ọ we doziere ya ime-ulo uku, ma n'ebe ahu ka ha nētiye na mb͕e gara aga onyinye-inata-iru-ọma, na frankincense, na ihe ulo Chineke nile, na otù uzọ n'uzọ iri nke ọka na manya-vine ọhu na manu, bú ihe enyere n'iwu nke ndi Livai na ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama; na àjà-nbuli nke ndi-nchu-aja.


M'we kwue, ha we me ka ime-ulo nile di ọcha: m'we chighachi n'ebe ahu ihe ulo Chineke, ha na onyinye-inata-iru-ọma na frankincense.


na i gēme ka nwa ọ bula nke meghere àkpà-nwa gabigara Jehova, ya na nwa ọ bula meghere àkpà-nwa, bú nwa anu-ulo muru, nke i nwere; ndi bu oké ka Jehova gēnwe.


Dorom nwa ọ bula eburu uzọ mu nsọ, bú nwa meghere àkpà-nwa ọ bula n'etiti umu Israel, ma n'etiti madu ma n'etiti anumanu: nkem ka ọ bu.


Unu gēsite n'ebe-obibi-unu weta ob͕e achicha abua nke àjà-ofufé, nke uzọ abua n'uzọ iri nke ephah: utu ọka flour ka ha gābu, ihe nēko achicha ka agēji si ha, iburu Jehova nkpuru mbu.


Webatanu otù uzọ n'uzọ iri nile n'ulo-àkù nkem, ka ihe-oriri we di n'ulom, biko, nwanum na nka, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, ma M'gaghi-emeghere unu window nile nke elu-igwe, wusara unu ngọzi, rue mḅe ọnọdu agaghi-ezu inagide ya.


Madu, ọ̀ gāpunara Chineke ihe? ma unu nāpunaram ihe. Ma unu nāsi, Nìme gini ka ayi punaraworo Gi ihe? N'otù uzọ n'uzọ iri nile na àjà-nbuli nile.


Nwa ọ bula nke meghere àkpà-nwa, nke anu-aru nile nke ha nēweta nso Jehova, n'etiti madu na n'etiti anu-ulo, ọ bu nke gi: nání i ghaghi ib͕aputa nwa madu buru uzọ mu, nwa anu-ulo ruru árú buru uzọ mu ka i gāb͕aputa kwa.


Anu-ha bu kwa nke gi, dika okpukpu-obi nke àjà-ofufé, na dika utaku-ukwu aka-nri, nke gi ka ọ bu.


Ma umu Livai, le, ha ka M'nyeworo otù uzọ n'uzọ iri nke ihe nile n'Israel, ibu ihe-nketa, dika ihe-nkwughachi òfùfè-ha, nke ha onwe-ha nēfè, bú òfùfè nke ulo-ikwū nzute.


Ma ọ buru na nkpuru mbu di nsọ, ob͕e utu ọka agwọrọ agwọ di kwa nsọ: ọ buru kwa na nkpọrọgwu di nsọ, alaka di kwa nsọ.


I ghaghi inye otù uzọ n'uzọ iri nke ihe-ọmume nile nke nkpuru-gi, bú ihe nke nēsi n'ubi-gi puta kwa-arọ.


Ihe mbu nke ọka-gi, na nke manya-vine ọhu gi, na nke manu-gi, na ihe mbu nke aji ìgwè ewu na aturu-gi, ka i gēnye ya.


na i gēwere ufọdu nime nkpuru mbu nke nkpuru nile nke ala-ubi, nke i gēsi n'ala-gi nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi webata; i gētiye kwa ya n'abọ, jerue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan