Ma onye-nlekọta ndi Livai nime Jerusalem bu Uzi nwa Bani, nwa Hashabaia, nwa Matanaia, nwa Maika, sitere n'umu Esaf, bú ndi-ọbù-abù, onye nēle ije-ozi nke ulo Chineke anya.
Ndi-isi ndi Livai kwa: Hashabaia, na Sherebia, na Jeshua nwa Kadimiel, na umu-nne-ha ndi nọ na ncherita-iru ha, ito Chineke na ikele ekele, dika ihe Devid, bú onye nke Chineke, nyere n'iwu si di, otù ihe-ndebe nēcherita ihe-ndebe ọzọ iru.