Nehemaya 1:3 - Bible Nso3 Ha we sim, Ndi fọduru, bú ndi fọduru site na ndọta-n'agha n'ebe ahu n'ala ahu anāchi achi nọ n'ọnọdu ọjọ na n'ita-uta: etipúsi-kwa-ra mb͕idi Jerusalem, sure kwa ọnu-uzọ-ama-ya nile ọku. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a3 Ha zara si: “Ndị ahụ niile lọtara nọ nʼoke nsogbu na ihere. A kụdara mgbidi Jerusalem; e sukwara ọnụ ụzọ ama ya niile ọkụ.” Faic an caibideil |
N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri; Dika awukwasiworo iwem na ọnumam n'aru ndi bi na Jerusalem, otú a ka agāwukwasi ọnumam n'aru unu, mb͕e unu batara n'Ijipt: unu gāghọ kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, na ihe-ita-uta; ma unu agaghi-ahu kwa ebe a ọzọ.