Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Nehemaya 1:2 - Bible Nso

2 Hanani, bú otù nime umu-nnem, we bia, ya onwe-ya na ndikom ufọdu ndi sitere na Juda; m'we jua ha ajuju bayere ndi-Ju, bú ndi-nb͕apu, nke fọduru site na ndọta-n'agha, na ajuju bayere Jerusalem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 otu nwanne m nwoke aha ya bụ Hanani, na ụfọdụ ndị ọzọ sitere Juda bịara ileta m. Ajụrụ m ha ajụjụ otu ihe si agara ndị Juu ahụ fọdụrụ, ndị si ebe dị iche iche lọta, jụọkwa ha maka Jerusalem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Nehemaya 1:2
12 Iomraidhean Croise  

Ma ndagwurugwu Sidim bu nání olùlù olùlù nke bitumen; ndi-eze Sọdọm na Gọmọra we b͕alaga, da n'ebe ahu, ndi fọduru we b͕alaga n'ugwu.


O me-kwa-ra ka Jerusalem nile, na ndi-isi nile, na ndi-dike nile bu dìnkpà, je biri n'ala ọzọ, bú orú nnù ise ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ha na onyeọ̀kà ọ bula na uzú ọ bula; ọ dighi onye fọduru, ọ bu nání ndi nēnweghi ike nime ndi ala ahu.


Ma ufọdu nime ndi ala ahu ndi nēnweghi ike ka onye-isi ndi-ob͕ū mere ka ha fọdu ibu ndi-ọlu-ubi-vine na ibu ndi-ọlụ-ubi.


àyi gālaghachi kwa mebie ihe nile I nyere n'iwu, we ghọ ọgọ ndi ahu ndi nēme ihe-árú ndia? Ì gaghi-ewesa ayi iwe, rue mb͕e emere ka ayi gwusi, ndi fọduru ma-ọbu ndi-nb͕apu we ghara idi?


na m'nyere Hanani, bú nwa-nnem, na Hananaia, bú onye-isi ulo uku eze, iwu bayere Jerusalem: n'ihi na onye ahu bu onye ezi-okwu, ọ nātu kwa egwu Chineke kari ọtutu madu.


ọ gaghi-adi kwa onye-nb͕apu ma-ọbu onye fọduru afọdu ndi Juda fọduru gēnwe, bú ndi bataworo n'ala Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu, ọbuná ilaghachi n'ala Juda, nke ha onwe-ha nāchọ si-ike ilaghachi ibi n'ebe ahu: n'ihi na ọ dighi onye gālaghachi ma-ọbughi ndi b͕apuru ab͕apu.


Ndi-unu b͕apuru ab͕apu gēcheta kwa Mu onwem n'etiti mba nile ebe adọtara ha n'agha, mb͕e M'tiwaworo obi-ha nke nākwa iko, nke siworo n'ebe M'nọ wezuga onwe-ya, na anya-ha, nke nākwaso arusi nile ha iko: ha gāsọ kwa onwe-ha oyi n'iru ha n'ihi ihe ọjọ nile nke ha meworo n'ihe-árú nile ha.


Ma ndi-ha b͕apuru ab͕apu gāb͕apu, nọ n'ugwu nile dika nduru nke ndagwurugwu, ha nile nēkwo ákwá, onye ọ bula n'ajọ omume-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan