Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 9:21 - Bible Nso

21 Ma-ọbu ọkpu-ite, ò nweghi ike n'ebe urọ di, isite n'otù ọkpukpu-urọ ahu o doziri me nka ka ọ buru ihe gānara nsọpuru, me kwa nke-ọzọ ka ọ buru ihe agēme ihe-ihere?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Otu a kwa, onye ọkpụ ite o nweghị ike isite nʼotu ụrọ ahụ o nwere kpụọ ụdị ite ọbụla masịrị ya, ụfọdụ ite pụrụ iche na ụfọdụ e ji eje ozi nʼụlọ?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 9:21
13 Iomraidhean Croise  

Ihe nile ka Jehova kpuru n'ihi Onwe-ya: E, ọbuná onye nēmebi iwu nāluru ubọchi ihe ọjọ ọlu.


Anyu-ike, ọ̀ ga-egbu onwe ya n'aru onye ji ya eb͕u ihe? ma-ọbu mma-nkwọ, ọ̀ gēme onwe-ya uku megide onye nākwọ ya? dika agāsi na ndele gēfeghari ndi nēbuli ya, dika agāsi na nkpa-n'aka gēbuli onye nābughi osisi.


Ahuhu gādiri onye nāluso Onye kpuworo ya ọ̀gù! otù ejùjù nile nke ala! Urọ, ọ̀ gāsi onye nākpu ya, Gini ka i nālu? ma-ọbu ọlu-gi, ọ̀ gasi, Ọ dighi aka abua o nwere?


Ma ab͕ua a, Jehova, Nna-ayi ka I bu: ayi onwe-ayi bu urọ, Gi onwe-gi bu onye nākpu ayi; ọlu aka-Gi ka ayi nile bu.


Ọ̀ bu ite elelìri elelì nke etipiara etipia ka nwoke a, bú Konaia, bu? ọ̀ bu ihe nke nādighi-atọ utọ? gini mere eji tufu ha-ri, ya onye-ya na nkpuru-ya, tukwasi ha n'ala nke ha nāmaghi?


Elodawo Israel: ub͕u a ha aghọwo ihe dika ihe nādighi-atọ utọ n'etiti mba nile.


Ma Onye-nwe-ayi siri ya, Ga: n'ihi na onye ahu bu ihe-ọlu arọputara nyem, ka o buru aham che n'iru mba ọzọ na ndi-eze, na umu Israel:


n'ihi na mb͕e akāmughi umu ahu, mb͕e ha akēmeghi kwa ihe ọ bula, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe nādighi nma, ka ihe Chineke zubere dika nrọputa si di we digide, o siteghi n'ọlu, kama o sitere n'Onye nākpọ,


Ya mere otú a ọ bu onye Ọ nāchọ ka Ọ nēmere ebere, ọ bu kwa onye Ọ nāchọ ka ọ nēme ka o nwe obi-etili.


Ajuju kwesikariri iju, gi madu, bu, Gì onwe-gi bu onye, nke nāza Chineke okwu imegide Ya? Ọ̀ gābu na ihe akpuworo gāsi onye kpuru ya, Gini mere i kpurum otú a?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan