Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 8:8 - Bible Nso

8 ndi nke nọ n'anu-aru apughi kwa itọ Chineke utọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ya mere, ndị na-erubere anụ ahụ ha isi apụghị ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 8:8
16 Iomraidhean Croise  

ma le, olu sitere n'elu-igwe, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma.


Jisus zara, si ya, N'ezie, n'ezie, asi mi, Ọ buru na amughi madu ọzọ, ọ pughi ihu ala-eze Chineke anya.


Mu na Onye ziterem nọ kwa; Ọ rapughi nání Mu; n'ihi na Mu onwem nēme ihe nātọ Ya utọ mb͕e nile.


n'ihi na, ọ bu ezie na ha mara Chineke, ma ha enyeghi Ya otuto dika Chineke, ha ekeleghi kwa Ya; kama emere ha ihe-efu n'ihe nile ha nātule n'obi-ha, obi-ha nke nēnweghi nghọta b͕a-kwa-ra ọchichiri.


N'ihi na mb͕e ayi nọ n'anu-aru, ọchichọ ọjọ nile nke diri nmehie nile ayi, nke sitere n'aka iwu ahu, nālusi ọlu ike n'ihe nile di ayi n'aru imiri ọnwu nkpuru.


Ma unu onwe-unu anọghi n'anu-aru, kama unu nọ nime Mọ Nsọ, ma ọ buru na ọbu ezie na Mọ nke Chineke nēbi nime unu. Ma ọ buru na onye ọ bula enweghi Mọ nke Kraist, onye ahu abughi nke Ya.


Ma anamachọ ka unu buru ndi nādighi-echeb͕u onwe-unu. Onye nēnweghi nwunye nēcheb͕u onwe-ya n'ihe nke Onye-nwe-ayi, otú ọ gēme ihe gātọ Onye-nwe-ayi utọ:


Ma enwezuwom ihe nile, anamababiga kwa ókè: emewo ka m'zue ezù, ebe m'natara n'aka Epafrọdaitọs ihe nile si n'aka-unu bia, isisì nke ihe ísì utọ, àjà nke anānara nke-ọma, nke nātọ Chineke ezi utọ.


ka unu jegharia n'uzọ kwesiri Onye-nwe-ayi ime otú ọ gātọ Ya utọ n'uzọ nile, nāmi nkpuru n'ezi ọlu nile ọ bula, nāba kwa uba nime nmazu nke Chineke;


Umu, nāṅanu nti okwu ndi muru unu n'ihe nile, n'ihi na nka bu ihe nātọ ezi utọ nime Onye-nwe-ayi.


Ya mere nke fọduru, umu-nna-ayi, ayi nēkpere unu, nāriọ kwa unu nime Onye-nwe-ayi Jisus, ka, dika unu natara n'aka-ayi otú unu nāghaghi ijeghari na ime ihe gātọ Chineke utọ, ọbuná dika unu nējeghari, ka unu nābabiga ókè nke-uku kari.


Ma unu echezọla ime ihe di nma na ime ka unu na ndi ọzọ nwekọ ihe-unu: n'ihi na àjà di otú a nātọ Chineke ezi utọ.


Ya me ka unu zue okè n'ezi ihe nile ọ bula ime ihe Ọ nāchọ, nēme nime ayi ihe nātọ ezi utọ n'iru Ya, site n'aka Jisus Kraist; Onye otuto nile diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


ihe ọ bula ayi nāriọ kwa, ayi nānata ya n'aka-Ya, n'ihi na ayi nēdebe ihe nile Ọ nyere n'iwu, ayi nēme kwa ihe nile nātọ utọ n'iru Ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan