Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 8:36 - Bible Nso

36 Dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, N'ihi Gi ka anēme ka ayi nwua ogologo ubọchi dum; Aguru ayi dika aturu ob͕ub͕u.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

36 Dịka e dere ya, “Ọ bụ nʼihi gị ka anyị na ọnwụ ji na-agba mgba ụbọchị niile. A na-ele anyị anya dịka atụrụ a gaje igbu egbu.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 8:36
18 Iomraidhean Croise  

Dika mb͕e madu nālu ọlu ubi we nēgwuwa ala, Otú a ka esesaworo ọkpukpu-ayi n'ọnu ala-mọ.


I nēme ayi ka ayi di ka ìgwè aturu agēri eri; N'etiti mba nile ka I fesawo-kwa-ra ayi.


N'ezie n'ihi Gi ka eb͕uworo ayi ogologo ubọchi nile; Aguwo ayi dika ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u.


Achiri ya n'ihe-ike, ma ya onwe-ya wedara onwe-ya n'ala, we ghara isaghe ọnu-ya; dika aturu nke anākpuru ije n'ob͕ub͕u-ya, na dika nne-aturu nke dara ob͕i n'iru ndi nākpacha ya aji; e, ọ dighi-asaghe ọnu-ya.


Ma mu onwem di ka nwa-aturu azùbiri azùbi nke anākpuru ije n'ob͕ub͕u-ya; ma amaghm na ọ bu mu ka ha zubereri nzube megide, si, Ka ayi bibie osisi na ihe-oriri-ya, ka ayi bipu kwa ya n'ala ndi di ndu, ka ewe ghara icheta kwa aha-ya ọzọ.


Ma Gi onwe-gi maram, Jehova; I nāhum, nwa kwa nkpuru-obim n'ebe I nọ: dọkpupu ha dika ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u, do ha nsọ nye ubọchi ob͕ub͕u.


M'gēme ka ha rida dika umu-aturu ka ewe b͕ue ha, dika ebulu, ha na nkpi.


Ha gāchupu unu nime ulo-nzukọ: e, oge hour nābia, ka ọ gābu na onye ọ bula nke gēb͕u unu gēchè na ọ nējere Chineke ozi.


Ma akpọghm ndum ihe, dika ihe oké ọnu-ahia n'ebe mu onwem nọ, ka m'we b͕azue ọsọm, jezu kwa ozi nke m'natara n'aka Onye-nwe-ayi Jisus, ikwusi ozi ọma ahu ike, bú nke amara nke Chineke.


Ma ibe ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nke ọ nāgu bu nka, Esekpuru Ya, dika aturu, je ob͕ub͕u; Dika nwa-aturu da-kwa-ra ob͕i n'iru onye nākpacha ya aji, Otú a ka Ọ nādighi-asaghe ọnu-Ya:


Gini me-kwa-ra ayi onwe-ayi nānọ n'ize-ndu oge hour nile ọ bula?


Ejim inya-isi ahu n'aru-unu, umu-nnam, nke m'nānya nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi, we kwusie ike na anamanwu kwa-ubọchi.


N'ihi na anamechè na Chineke were ayi, bú ndi-ozi, gosi, dika ndi-ikpe-azu, dika ndi amara ikpé ọnwu: n'ihi na emere ayi ihe-nkiri nye uwa na ndi-mọ-ozi na madu.


e, ayi onwe-ayi enwewo ọziza azara nime onwe-ayi na ọ bu ọnwu, ka ayi we ghara itukwasi obi n'onwe-ayi, kama ọ bu na Chineke Onye nēme ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie:


Hà bu ndi nējere Kraist ozi? (anamekwu dika onye anya nādighi nma) mu onwem nēje kari; anamadọb͕ubiga onwem ókè n'ọlu kari, anamanọbiga ókè n'ulo-nkpọrọ kari, anāpiam utari nke-uku ri nne, anọm n'ọnu ọnwu ọtutu mb͕e.


dika ndi anāmaghi aha-ha, ma amazuru ayi; dika ndi nānwu anwu, ma le, ayi di ndu; dika ndi anēme ka ha muta ihe site n'ahuhu, ma adighi-eme ka ayi nwua;


ka m'we mara Ya, na ike nke nbilite-n'ọnwu-Ya, na nnwekọ nke ahuhu-Ya nile, n'ihi na anēme ka mu na Ya nwekọ otù udi n'ọnwu-Ya;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan