Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 8:25 - Bible Nso

25 Ma ọ buru na ayi nēle anya ihe ayi nāhughi anya, ayi ji ntachi-obi nēchesi ya ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Ma ọ bụrụ na olileanya anyị dabeere nʼihe ahụ anyị na-enwetabeghị, anyị ga-eji ndidi chere tutu ihe ahụ erute anyị aka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 8:25
26 Iomraidhean Croise  

Nzọputa-Gi ka m'cheworo, Jehova


Nēle anya Jehova: Di ike, ka obi-gi nwe kwa ume; E, nēle anya Jehova.


Ọ bu nání Chineke ka nkpuru-obim nēdere du: N'aka-Ya ka nzọputam si bia.


Agāsi kwa n'ubọchi ahu, Le, Chineke-ayi ka Nka bu; ayi elewo anya Ya, Ọ gāzọputa kwa ayi: Nka bu Jehova; ayi elewo anya Ya, ka ayi tegharia egwú ọṅù ṅuri kwa na nzọputa-Ya.


Ọzọ, n'uzọ nke ikpé-Gi nile, Jehova, ka ayi leworo anya Gi: aha-Gi na ncheta-Gi nāti nkpuru-obi-ayi akpiri.


Na ntachi-obi-unu unu gānata nkpuru-obi-unu.


Nkpuru nke di n'ala ọma ahu, ndia bu ndi were ezi obi di nma jisie okwu ahu ike, mb͕e ha nuru ya, ha were kwa ntachi-obi mia nkpuru.


n'akuku olile-anya-unu, nāṅurinu ọṅu; n'akuku nkpab͕u-unu, nēnwenu ntachi-obi; n'akuku ekpere-unu, nānọgidesinu ike;


ndi site na ntachi-obi n'ezi ọlu nāchọ otuto na nsọpuru na apughi-imebi ka Ọ gēnye ndu ebighi-ebi:


Ma ọ bughi nání nka, kama ayi onwe-ayi, ndi nwere nkpuru mbu nke Mọ Nsọ, ọbuná ayi onwe-ayi nāsu kwa udè nime onwe-ayi, mb͕e ayi nēchesi ido-ka-nwa-nwoke ahu ike, bú nb͕aputa nke aru-ayi.


ebe anēme ka unu di ike nime ike nile, dika ike nke ebube-Ya si di, rue ntachi-obi na ogologo-ntachi-obi nile, ya na ọṅù;


ebe ayi nēcheta nēwepughi aka ọlu nke okwukwe unu na ndọb͕u-n'ọlu nke ihunanya unu na ntachi-obi nke olile-anya unu ji ele anya Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, n'iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi;


Ma Onye-nwe-ayi duzie obi-unu bà n'ihunanya nke Chineke, bà kwa na ntachi-obi nke Kraist-ayi.


N'ihi na ntachi-obi di unu nkpà, ka ọ gābu, mb͕e unu meworo ihe Chineke nāchọ, ka unu we nata nkwa ahu.


ka unu we ghara ighọ ndi ume-ngwu, kama ka unu we buru ndi nēṅomi ndi ahu ndi ji okwukwe na ogologo-ntachi-obi nēketa nkwa ahu.


Otú a o we nwe ogologo-ntachi-obi, we nata kwa nkwa ahu.


Mu onwem, bú Jọn, nwa-nna-unu na onye nēso unu nwekọ nkpab͕u na ala-eze na ntachi-obi nke di nime Jisus, emere ka m'nọ n'agwe-etiti ahu nke anākpọ Patmọs, n'ihi okwu Chineke na àmà Jisus.


Ọ buru na ọ diri onye ọ bula ka adọta ya n'agha, ọ bu n'agha ka agādọta ya: ọ buru na onye ọ bula gēji mma-agha b͕u madu, aghaghi iji mma-agha b͕u ya. Nebe a ka ntachi-obi na okwukwe nke ndi nsọ di.


N'ebe a ka ntachi-obi ndi nsọ di, bú ndi nēdebe ihe Chineke nyere n'iwu, na okwukwe Jisus.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan