Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 8:13 - Bible Nso

13 n'ihi na asi na unu nādi ndu dika anu-aru si chọ, unu gaje inwu; ma ọ buru na unu nēwere Mọ Nsọ me ka omume aru nwua, unu gādi ndu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Ọ bụrụ na unu na-ebi ndụ dịka anụ ahụ si chọọ, unu ga-anwụ. Ma ọ bụrụ na unu ga-eji ike nke Mmụọ Nsọ mee ka omume niile nke anụ ahụ nwụọ, unu ga-adị ndụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 8:13
20 Iomraidhean Croise  

Ọ buru na o nwe ọmiko n'aru ya, we ghara irapu ya, Kama ọ nēb͕ochi ya nokpo-ọnu-ya;


Ọ̀ bu nkpuru gini kwa ka unu nwere n'oge ahu n'ihe nile ahu nke ihere ha nēme unu ub͕u a? n'ihi na ọgwugwu ihe nile ahu bu ọnwu.


N'ihi na ugwọ-ọlu nke nmehie bu ọnwu; ma onyinye-amara nke Chineke bu ndu ebighi-ebi nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi.


N'ihi na mb͕e ayi nọ n'anu-aru, ọchichọ ọjọ nile nke diri nmehie nile ayi, nke sitere n'aka iwu ahu, nālusi ọlu ike n'ihe nile di ayi n'aru imiri ọnwu nkpuru.


Ya mere otú a, umu-nnam, ayi bu ndi ji ugwọ̀, ọ bughi anu-aru ka ayi ji, idi ndu dika anu-aru si chọ:


ma anametiputa arum ọnyá, me kwa ya ka ọ buru orùm: ka mu onwem ghara ighọ onye ajuru aju n'uzọ ọ bula, mb͕e m'kwusasiri okwu Chineke nye ndi ọzọ.


Ma ndi nke Kraist-ayi Jisus kpọgidere anu-aru-ha n'obe, ya na ọchichọ ọjọ nile na agu ihe ọjọ nile di ya.


N'ihi na onye nāgha nkpuru nye anu-aru onwe-ya gēsite n'anu-aru ahu weta nmebi dika ihe-ubi; ma onye nāgha nkpuru nye Mọ Nsọ gēsite na Mọ Nsọ weta ndu ebighi-ebi dika ihe-ubi


ka unu tupu madu ochie unu, nke nēmebi emebi n'uzọ agu nke aghughọ, dika ibi-obi-unu na mbu si di;


Unu eme-kwa-la ihe gēwuta Mọ Nsọ nke Chineke, Onye akara unu akàrà nime Ya rue ubọchi nb͕aputa.


Unu aṅubiga-kwa-la manya ókè, nke ndu ila-n'iyì di nime ya, kama juputanu na Mọ Nsọ;


nādọ ayi aka na nti ka ayi we ju asọpurughi-Chineke na agu ihe ọjọ di n'uwa, we di ndu uche zuru okè na nke ezi omume na nke isọpuru-Chineke n'oge di ub͕u a;


Ebe unu meworo nkpuru-obi-unu ka ha di ọcha n'iṅa-nti nke unu ṅara ezi-okwu, iwere ihu-n'anya nke iru-abua nādighi ya hu umu-nna-unu n'anya, sitenu n'obi-unu hurita onwe-unu n'anya si-ike:


Ndi m'huru n'anya, ariọm unu dika ndi-ọbìa na ndi nọ dika ọbìa, ka unu ghara ime ihe ọjọ di iche iche nāgu anu-aru, nke bu ihe nēbu agha imegide nkpuru-obi;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan