Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 7:9 - Bible Nso

9 Ma mu onwem nādi ndu otù mb͕e n'oge iwu nādigh: ma mb͕e ihe enyere n'iwu biara, nmehie ahu we di ndu ọzọ, mu onwem we nwua;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Na mbụ, abụ m onye dị ndụ mgbe iwu na-adịghị, ma mgbe iwu bịara, e mere ka mmehie nwe ntute.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 7:9
22 Iomraidhean Croise  

N'ihi na ihe ọjọ nādighi ọnu-ọgugu ab͕awom buruburu, Ajọ omumem nile eruwom aru, apughkwam ihu uzọ; Ha kariri agiri-isi nile nke isim n'uba, obim arapuwokwam.


Nwa-okorọbia ahu si Ya, Ihe ndia nile ka m'ribara ama: gini fọdurum ọzọ ime?


Ma ọ zara, si nna-ya, Le, ọtutu arọ ndia ka m'bu orù-gi, ọ dighi kwa mb͕e ọ bula m'rapuru ihe i nyere n'iwu: ma ọ dighi mb͕e ọ bula i nyerem nwa-ewu, ka obi we tọ mu na ndi-eyìm utọ:


Ma ọ siri, Ihe ndia nile ka m'ribara ama site n'okorọbia.


N'ihi na Moses edewo n'akwukwọ na madu nke nēme ezi omume nke sitere n'iwu gādi ndu nime ya.


ihe ahu enyere n'iwu, nke nēdubà na ndu, nka ka m'huru na ọ bu ihe nēdubà n'ọnwu:


n'ihi na nmehie, ebe ọ natara ihe ọ gēji megidem, o sitere n'ihe enyere n'iwu ghọb͕uem, site kwa na ya b͕uem.


Ya mere, umu-nnam, esite-kwa-ra n'aru Kraist me ka unu onwe-unu nwua n'ebe iwu di; ka unu we lakuru di di iche, bú Onye emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ka ayi we miara Chineke nkpuru.


Ma ub͕u a atọpuwo ayi n'iwu ahu, ebe ayi nwuru n'ebe ihe ahu di nke ejidesiri ayi ike nime ya; ya mere ayi nābu orù n'idi-ọhu nke Mọ Nsọ, ọ bughi kwa n'idi-ochie nke ihe edeworo n'akwukwọ.


ma nmehie, ebe ọ natara ihe ọ gēji megidem, o were ihe enyere n'iwu luta agu ihe ọjọ nile n'otù n'otù nimem: n'ihi na nmehie bu ihe nwuru anwu ma iwu adighi ya.


n'ihi na itukwasi uche n'anu-aru, ya na Chineke di n'iro; n'ihi na edoghi ya n'okpuru iwu Chineke, n'ihi na apughi kwa ido ya n'okpuru ya:


N'ihi, na mu onwem sitere n'aka iwu nwua n'ebe iwu di, ka m'we di ndu n'ebe Chineke nọ


N'ihi na ka ha ra, bú ndi sitere n'ọlu nke iwu, ha nọ n'okpuru ọbubu-ọnu: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye anābu ọnu ka ọ bu, bu onye ọ bula nke nānọgideghi n'ihe nile edeworo n'akwukwọ iwu, ime ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan