Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 7:1 - Bible Nso

1 Ma-ọbu ùnu amaghi, umu-nnam (n'ihi na anamagwa ndi mara iwu okwu), na iwu bu onye-nwe madu ka oge ra ọ nādi ndu?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Ọ bụ na unu amaghị ụmụnna m, unu ndị maara iwu nke ọma na ọ bụ oge mmadụ dị ndụ ka iwu na-ejide ya?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 7:1
12 Iomraidhean Croise  

Ma gi onwe-gi, Ezra, dika amam-ihe nke Chineke-gi nke di n'aka-gi si di, guputa ndi-ikpe na ndi-odozi-okwu, ndi gāburu ndi nile nọ n'ofè osimiri, bú ndi nile mara iwu Chineke-gi, ndi-odozi-okwu; me-kwa-nu ka ọ mara iwu ahu, bú onye nāmaghi.


N'ihi na oriọna ka ihe ahu enyere n'iwu bu; iwu ahu bu kwa ìhè; Ọ bu kwa uzọ ndu ka iba-nba nile nke idọ-aka-na-nti bu:


Ma achọghi m ka unu ghara imara, umu-nnam, na ọtutu mb͕e m'zubere ibiakute unu (eb͕ochi-kwa-ram ibia rue ub͕u a), ka m'we nwe kwa nkpuru ufọdu n'etiti unu, dika ọ di kwa n'etiti ndi mba ọzọ fọduru.


Umu-nnam, ihe di obim ezi nma na aririọ m'nāriọ Chineke n'ihi ha bu, ka azọputa ha.


N'ihi na Kraist bu nsọtu iwu iwetara onye ọ bula nke kwere ezi omume.


N'ihi na nmehie agaghi-abu onye-nwe-unu: n'ihi na unu anọghi n'okpuru iwu, kama n'okpuru amara.


Ma-ọbu ùnu amaghi na ka ayi-ra, bú ndi emere baptism iba nime Kraist Jisus, emere ayi baptism ibà n'ọnwu-Ya?


Ma ub͕u a atọpuwo ayi n'iwu ahu, ebe ayi nwuru n'ebe ihe ahu di nke ejidesiri ayi ike nime ya; ya mere ayi nābu orù n'idi-ọhu nke Mọ Nsọ, ọ bughi kwa n'idi-ochie nke ihe edeworo n'akwukwọ.


N'ihi na anamekperi ekpere, ka mu onwem buru anathema pua n'ebe Kraist nọ n'ihi umu-nnem, ndi-ikwum dika anu-aru si di:


Ọ̀ gabu na anamekwu ihe ndia dika madu si ekwu? ma-ọbu ìwu Chineke adighi-ekwu kwa ihe ndia?


Gwanum, unu ndi nāchọ inọ n'okpuru iwu, ùnu adighi-anu iwu ahu?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan