Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 6:16 - Bible Nso

16 Ùnu amataghi na onye unu nēche onwe-unu n'iru ya ka unu buru ndi-orù iṅa ya nti, unu bu ndi-orù nke onye ahu unu nāṅa nti ya; ma-ọbu nke nmehie nēweta ọnwu, ma-ọ̀bu nke iṅa-nti nēweta ezi omume?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Ọ bụ na unu amataghị na mgbe unu weere onwe unu nye mmadụ irubere ya isi dịka ohu, unu bụ ohu nye onye ahụ unu na-erubere isi, maọbụ ohu nye mmehie nke na-eduba nʼọnwụ, ma ọ bụkwanụ irube isi nke na-eduba nʼezi omume?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 6:16
18 Iomraidhean Croise  

Ọ buru na i nēme nke-ọma, ọ̀ bughi nb͕asa-iru ka i gēnwe? ọ buru kwa na i meghi nke-ọma, n'ọnu-uzọ ka nmehie nāma-kpu dika anu-ọhia: ọ bu kwa n'ebe i nọ ka ọchichọ-ya di, ma ọ kwesiri ka gi onwe-gi chia ya.


o we si ndi ahu, Unu onwe-unu ga kwa n'ubi-vine nkem, ihe ọ bula ziri ezi ka m'gēnye unu. Ha we je.


Ọ dighi onye ọ bula puru ibu orù nke nna abua: n'ihi na ọ gākpọ otù onye nime ha asì, hu ibe-ya n'anya; ma ọ bughi otú a ọ gējide otù, lelìa ibe-ya anya. Unu apughi ibu orù Chineke na àkù.


Jisus zara ha, si, N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye ọ bula nke nēmehie bu orù nmehie.


Chineke enupughi ndi-Ya nke O buru uzọ mara. Ma-ọbu ùnu amataghi ihe ọ nēkwu, bú ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, n'ebe edeworo okwu bayere Elaija? otú ọ nāriọ Chineke aririọ megide Israel, si,


Ya mere, umu-nnam, ejim obi-ebere nile nke Chineke nāriọ unu, ka unu che aru-unu n'iru Chineke, dika àjà di ndu, di nsọ, nke di Chineke ezi utọ, nke bu ikpe-ekpere-unu dika uche si di.


Ma ekele diri Chineke, na unu buri ndi-orù nke nmehie, ma unu sitere n'obi-unu ṅa nti ihe-atù nke ozizi ahu nke arara unu nye n'aka-ya;


Ùnu amataghi na unu bu ulo nsọ Chineke, Mọ nke Chineke bi kwa nime unu?


Ihe-inya-isi-unu adighi nma. Ùnu amataghi na ihe-iko-achicha di ntà nēko ob͕e utu ọka agwọrọ agwọ dum?


Ma-ọbu ùnu amataghi na ndi nsọ gēkpe uwa ikpé? ọ buru kwa na agaje ikpe uwa n'iru unu, ùnu ekwesighi inọ dika ndi-ikpé n'ulo-ikpé dikarisiri ntà?


Ùnu amataghi na ayi gēkpe ndi-mọ-ozi ikpé? àyi gēsi aṅa ghara inwe ike ikpe ihe nke ndu a?


Ma-ọbu ùnu amataghi na ndi ajọ omume agaghi-eketa ala-eze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu: ndi nākwa iko, ma-ọbu ndi nēkpere arusi, ma-ọbu ndikom nākwa iko, bú ndi nwere nwunye, ma-ọbu ndikom nēme dika ndinyom, ma-ọbu ndikom nēmeru onwe-ha n'aru ndikom,


Ùnu amataghi na ndi nālu ọlu n'ulo uku Chineke nēri ihe si n'ulo uku Chineke puta, na ndi nānọ kwa n'iru ebe-ichu-àjà nēso ebe ichu-àjà ahu nēkekọ ihe?


Ùnu amataghi na ndi nāb͕a ọsọ n'ebe ọsọ, ha nile nāb͕a ọsọ, ma ọ bu otù onye nāb͕ata ihe ọsọ? Nāb͕anu otú a, ka unu we b͕ata.


Ma ọ buru na ọ jọ njọ n'anya-unu ifè Jehova òfùfè, rọputaranu onwe-unu ta onye unu gēfè òfùfè; ma ọ bu chi nile nke nna-unu-hà fère òfùfè nke di n'ofè Osimiri ahu, ma-ọbu chi nile nke ndi-Amorait, ndi unu onwe-unu bi n'ala-ha: ma mu onwem na ulom, ayi gēfè Jehova òfùfè.


ha nēkwe kwa ha nkwa na ha gēnwe onwe-ha, ọ bu ezie na ha onwe-ha bu orù nke nmehie; n'ihi na ihe meriworo madu, ihe a ka emewo-kwa-ra ka onye ahu buru orù-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan