N'ihi na ka ha ra, bú ihe edere n'akwukwọ nsọ n'oge gara aga, edere ha izí ayi ihe, ka ayi we were ntachi-obi na nkasi-obi nke ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ nwe olile-anya.
bú olile-anya nke ayi nwere dika ihe njiko nke nkpuru-obi, nke bu ihe-ntukwasi-obi na ihe nēguzosi ike, nke nābà kwa nime ebe ahu nke di nime ákwà-nb͕ochi;
Ngọzi nādiri nwoke onye nātachi obi n'ọnwunwa: n'ihi na mb͕e anwaputaworo ya, ọ gānata okpu-eze ahu, bú ndu, nke Onye-nwe-ayi kwere nkwa inye ndi huru Ya n'anya.
Ma Chineke nke amara nile, Onye kpọbatara unu n'ebube ebighi-ebi Ya nime Kraist, mb͕e unu huworo ahuhu nwa oge, Ya onwe-ya gēme ka unu zue okè, me kwa ka unu guzosie ike, me kwa ka unu di ike, tọ kwa unu ntọ-ala.