Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 5:18 - Bible Nso

18 Ya mere otú a, dika ikpé ahu sitere n'otù ndahie bia rue madu nile iwetara ha amam-ikpe; ọbuná otú a ka onyinye-amara ahu sitere n'otù ọlu ezi omume bia rue madu nile igu ha na ndi ezi omume ka ha nata ndu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Ya mere, dịka otu njehie si weta ikpe ọmụma nye mmadụ niile, otu ahụ kwa ka e si gụọ mmadụ niile dịka ndị ezi omume na ndị nwere ndụ site nʼotu ọrụ ezi omume.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 5:18
17 Iomraidhean Croise  

Ihe nke sitere na ndọb͕u nkpuru-obi-ya nādọb͕u onwe-ya n'ọlu ka ọ gāhu, afọ gēju ya: ihe-ọmuma-ya ka onye ezi omume ahu, bú orùm, gēji me ka ọrà madu ghọ ndi ezi omume: ajọ omume nile ha ka ya onwe-ya gēbu kwa.


Onye ahu biara ib͕a àmà, ka o we b͕ara Ìhè ahu àmà, ka madu nile we site n'aka-ya kwere.


Mu onwem, ọ buru na eweliem elu site n'ala, M'gādọrọ kwa madu nile nye onwem.


Ha we biakute Jọn, si ya, Rabai, Onye gi na Ya nọ n'ofè Jọdan, Onye gi onwe-gi b͕aworo àmà nye Ya, le, Onye ahu nēme baptism, madu nile nābiakute kwa Ya.


ọ bu kwa nime Onye a ka anāgu onye ọ bula nke kwere na Ya n'onye ezi omume n'ihe nile, nke anāpughi igu unu na ndi ezi omume na ha nime iwu Moses.


Onye Chineke chere n'iru ọra madu ka Ọ buru ihe ijuru Ya obi, site n'okwukwe ekwere n'ọbara-Ya, igosi ezi omume-Ya, n'ihi nb͕aghara nmehie nile emehiereri n'oge gara aga, n'oge nnagide nke Chineke;


Onye arara Ya nye n'ihi ndahie-ayi nile, ewe me ka O si n'ọnwu bilie n'ihi igu ayi na ndi ezi omume.


N'ihi nka, dika nmehie si n'aka otú madu ba n'uwa, dika ọnwu si n'aka nmehie ba kwa; ọnwu we si otú a gabiga rue madu nile, n'ihi na madu nile mehiere:


Ma dika ndahie ahu si di, ọ bughi otú a ka onyinye-amara si di kwa. N'ihi na asi na ọra madu nwuru site na ndahie nke otù onye ahu, amara Chineke, na onyinye ahu nke di nime amara nke otù Madu ahu, Jisus Kraist, babigara ókè kari ri nne rue ọra madu.


N'ihi na dika edoro ọra madu na ndi-nmehie site n'aṅaghi-nti nke otù madu ahu, ọbuná otú a ka agēdo ọra madu na ndi ezi omume site n'iṅa-nti nke otù Onye ahu.


N'ihi na nmehie agaghi-abu onye-nwe-unu: n'ihi na unu anọghi n'okpuru iwu, kama n'okpuru amara.


N'ihi na dika ọnwu diri madu nile nime Adam, ọ bu kwa otú a ka agēme ka madu nile di ndu nime Kraist ahu.


Ma Onye ahu Nke emere Ya ka ọ di kari ndi-mọ-ozi ala nke-ntà, bú Jisus, Ya ka ayi nēle anya, na ejiwo ebube na nsọpuru kpube Ya n'isi dika okpu-eze n'ihi ahuhu nke ọnwu, ka O we site n'amara Chineke detu ọnwu ire n'ihi madu nile ọ bula.


Saimon Pita, orù na onye-ozi nke Jisus Kraist, nēdegara unu akwukwọ, bú ndi ketaworo okwukwe di oké ọnu-ahia ra ka nke ayi ketaworo n'ezi omume Onye ahu, bú Chineke-ayi na Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist;


Unu onwe-unu nwe-kwa-ra otite-manu site n'Onye Nsọ ahu, unu mata-kwa-ra ihe nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan