Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 5:14 - Bible Nso

14 Otú ọ di, ọnwu si n'oge Adam buru eze rue oge Moses, ọbuná ichiri ndi nēmehieghi n'oyiyi nke njehie Adam, onye bu ihe-atù nke Onye ahu gaje ibia.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Ma e mere ka ọnwụ rute onye ọbụla site nʼoge Adam ruo nʼoge Mosis. O metụtara ọ bụladị ndị mmehie ha na-adịghị ka nke Adam, onye bụ ihe atụ nke onye ahụ gaje ịbịa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 5:14
17 Iomraidhean Croise  

O we kwatue obodo ndia, na Buruburu-ala ahu nile, na ndi nile bi n'obodo ahu nile, na ihe-opupú nke ala.


Ken we si Ebel, bú nwa-nne-ya, Ka ayi je n'ọhia. O rue, mb͕e ha nọ n'ọhia, na Ken biliri imegide Ebel, bú nwa-nne-ya, we b͕ue ya.


ihe ọ bula nke ume nke mọ nke ndu di n'oghere-imi-ya abua, nime ihe nile ọ bula nke di n'ala-ọkpọ-nku, ọ nwuru anwu.


Fero we nye ndi-ya nile iwu, si, Nwa-nwoke ọ bula amuru, n'osimiri Nail ka unu gētufu ya, ma unu gēdebe nwa-nwayi ọ bula ndu.


Josef we nwua, ya na umu-nne-ya nile, na ọb͕ọ ahu nile.


Ma ndi ahu agabigawo pua n'ọb͕ub͕a-ndum, dika Adam: n'ebe ahu ka ha ghọb͕uworom.


Mu onwem kwa, M'gaghi-emere Nineve ebere, bú obodo uku ahu; nke ihe kari orú nnù madu uzọ iri-na-ise nọ nime ya, bú ndi nāmaghi nke bu aka-nri-ha na aka-ekpe-ha; na ọtutu anumanu?


N'ihi nka, dika nmehie si n'aka otú madu ba n'uwa, dika ọnwu si n'aka nmehie ba kwa; ọnwu we si otú a gabiga rue madu nile, n'ihi na madu nile mehiere:


N'ihi na asi na ọnwu si n'aka otù onye ahu buru eze, site na ndahie nke otù onye ahu; ndi nānata nbabiga-ókè nke amara ahu na nke onyinye ahu, bú ezi omume, gābu kari eze ri nne na ndu site n'aka otù Onye ahu, bú Jisus Kraist.


ma, dika nmehie si buru eze n'onwu, ka amara we buru kwa eze otú a site n'ezi omume rue ndu ebighi-ebi site n'aka Jisus Kraist Onye-nwe-ayi.


N'ihi na edoro ihe ahu ekèrè èkè n'okpuru ihe-efu, ọ bughi na ọ chọrọ ya, kama n'ihi Onye ahu Nke doro ya n'okpuru ya n'olile-anya;


N'ihi na ayi matara na ihe ekère èkè nile nāsukọ udè, ime nēmekọ kwa ha, rue ub͕u a.


N'ihi na dika ọnwu diri madu nile nime Adam, ọ bu kwa otú a ka agēme ka madu nile di ndu nime Kraist ahu.


Otú a ka edewo-kwa-ra ya n'akwukwọ, si, Madu mbu, bú Adam, ghọrọ nkpuru-obi di ndu. Adam ikpe-azu ghọrọ mọ nke nēnye ndu.


Dika ọ bu kwa ihe edebeworo madu ka ha nwua anwu nání otù mb͕e, ma mb͕e nka gasiri ikpé eso ya;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan