Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 4:9 - Bible Nso

9 Ọ̀ bu kwa ndi obibì-úgwù ka anākpọ ndi ngọzi a diri, ma-ọbu kwa ndi ebìghi-úgwù? n'ihi na ayi nāsi, Aguru okwukwe Abraham nye ya dika ezi omume.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ngọzị a ọ dịrị naanị ndị e biri ugwu ka ọ bụ nyekwa ndị a na-ebighị ugwu? Ihe anyị na-ekwu bụ na a gụrụ okwukwe Ebraham dị ka ezi omume nye ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 4:9
14 Iomraidhean Croise  

Ọ we kwere na Jehova; Ọ we gua ya nye ya n'ezi omume.


O we si, Ọ bu ihe di kari nfe na i gāburum orù, ime ka ebo nile nke Jekob bilie, na ime ka ndi Israel echebere echebe lata: enyewokwam i ka i buru ìhè nke mba nile, ibu nzọputam rue nsọtu uwa.


Ìhè agēkpughere mba nile ọzọ, Na ebube ndi-Gi, bú Israel.


Èsi kwa aṅa gu ya? àguru ya nye ya mb͕e ọ nọ n'obibì-úgwù, ma-ọbu mb͕e ọ nọ n'ebìghi-úgwù? Ọ bughi n'obibì-úgwù, kama ọ bu n'ebìghi-úgwù:


N'ihi na ọ̀ bu gini ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nēkwu? Abraham we kwere Chineke, ewe gua nke ahu nye ya dika ezi omume.


ka ngọzi nke Abraham we rue ndi mba ọzọ nime Kraist Jisus; ka ayi we site n'okwukwe ahu nara nkwa Nke bu Mọ Nsọ.


Ọ bu mu onwem, bú onye di ntà kari onye dikarisiri ntà n'etiti ndi nsọ nile, ka enyere amara nka, izisara ndi mba ọzọ ozi ọma nke àkù nke Kraist nke anēnweghi ike ituputa ya;


ebe onye-Grik na onye-Ju, obibì-úgwù na ebìghi-úgwù, onye nāsu asusu ọzọ, onye Sitia, orù, onye nwere onwe-ya, nāpughi idi: ma Kraist bu ihe nile, di kwa nime madu nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan