Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 3:30 - Bible Nso

30 asi na ọ bu ezie na Chineke bu otù, Onye gāgu ndi obibì-úgwù na ndi ezi omume site n'okwukwe, were kwa okwukwe ahu gua ndi ebìghi-úgwù na ndi ezi omume.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

30 Nʼihi na Chineke dị naanị otu, ọ bụ site nʼokwukwe ka ọ ga-anabata ndị ahụ ebiri ugwu, sitekwa nʼotu okwukwe ahụ gụọ ndị a na-ebighị ugwu ka ndị ezi omume.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 3:30
18 Iomraidhean Croise  

Ya mere ọ buru na onye ebìghi-úgwù nēdebe ihe nile iwu-gi guru n'ihe ziri ezi, àgaghi-agu ebìghi-úgwù-ya n'obibì-úgwù?


onye ebìghi-úgwù ka esi mu ya, ma ọ buru na ọ debezu iwu, ọ̀ gaghi-ekpe kwa gi ikpé, onye sitere n'ihe edeworo n'akwukwọ na obibì-úgwù bu onye-njehie n'iwu?


ma ọ bu ezi omume Chineke, site n'okwukwe ekwere na Jisus Kraist, nke diri ndi nile kwere: n'ihi na ọ dighi ihe di iche;


Ya mere ayi guru na anāgu madu n'onye ezi omume site n'okwukwe, mb͕e ọ kālughi ọlu iwu.


N'ihi nka o sitere n'okwukwe, ka o we di ka amara si di; ka nkwa ahu we guzosie ike n'ebe nkpuru ahu nile nọ; ọ bughi nání ndi sitere n'iwu ahu, kama ọ bu kwa ndi sitere n'okwukwe Abraham, onye bu nna nke ayi nile.


Ọ̀ bu kwa ndi obibì-úgwù ka anākpọ ndi ngọzi a diri, ma-ọbu kwa ndi ebìghi-úgwù? n'ihi na ayi nāsi, Aguru okwukwe Abraham nye ya dika ezi omume.


Ma onye-ob͕ub͕o abughi nke otù onye; ma Chineke bu otù onye.


Onye-Ju ma-ọbu onye-Grik apughi idi, orù ma-ọbu onye nwe onwe-ya apughi idi, nwoke na nwanyi apughi idi: n'ihi na unu onwe-unu nile bu otù onye nime Kraist Jisus.


Ma ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ebe o buru uzọ hu na Chineke nēsite n'okwukwe gu ndi mba ọzọ na ndi ezi omume, o buru uzọ zìe Abraham ozi ọma, si, Agāgọzi mba nile nime gi.


N'ihi na nime Kraist Jisus ọ dighi ike ọ bula obibì-úgwù ma-ọbu ebìghi-úgwù nwere; kama nke nwere ike bu okwukwe nke sitere n'aka ihu-n'anya alusi ọlu ike.


N'ihi na obibì-úgwù abughi ihe, ebìghi-úgwù abughi kwa ihe, kama ọ bu òkìkè ọhu.


Nuru, Israel; Jehova, bú Chineke-ayi, Jehova bu otù:


n'ihi na ayi onwe-ayi bu ndi obibì-úgwù, ndi ji Mọ nke Chineke nēkpe ekpere, ndi nānya kwa isi nime Kraist Jisus, ndi natukwasighi kwa obi n'anu-aru-ayi:


N'ihi na otù Chineke di, otù Onye-ob͕ub͕o di kwa n'ab͕ata Chineke na madu, Onye Ya onwe-ya bu madu, bú Kraist Jisus,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan