Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 3:27 - Bible Nso

27 Òle ebe inya-isi-ayi di kwa? Emechibidowo ya n'èzi. Sìte n'aha iwu gini? ọ̀ bu nke ọlu? É-è: kama ọ bu site n'iwu nke okwukwe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Mgbe o si otu a dịrị, olee ebe ịnya isi anyị dịkwa? Ajụla ịnabata ya. Ọ bụ site iwu dị aṅa? Ọ bụ nke ọrụ? Mba, kama ọ bụ site nʼokwukwe anyị nwere nʼime Kraịst.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 3:27
26 Iomraidhean Croise  

N'ubọchi ahu ka ihere omume-gi nile nāgaghi-eme gi, bú nke i jiworo jehie megidem: n'ihi na mb͕e ahu ka M'gēwezuga n'etiti gi ndi-gi nāṅuri ọṅu-agha nime npakọ, i gaghi-adi kwa npako ọzọ n'ugwu nsọm.


Onye nke kwere, nke eme-kwa-ra ya baptism, agāzọputa ya; ma agāma onye nke nēkweghi ikpé.


Onye kwere n'Ọkpara ahu nwere ndu ebighi-ebi; ma onye nēkweyeghi Ọkpara ahu agaghi-ahu ndu, kama iwe Chineke nānọgide n'aru-ya.


N'ihi na Moses edewo n'akwukwọ na madu nke nēme ezi omume nke sitere n'iwu gādi ndu nime ya.


Ma ọ buru na ọ di n'amara, o siteghi kwa ọzọ n'ọlu: ebe ahuru na amara abughi amara ọzọ, ma asi na ọ dighi otú a.


Ma ọ buru na akpọrọ gi onwe-gi aha onye-Ju, ọ buru kwa na i nēzu ike n'elu iwu, nānya kwa isi na Chineke,


gi onye nānya isi n'iwu, ì nēme Chineke ihe-ihere site na njehie-gi n'iwu ahu?


Ma ayi matara na ka ha ra, bú ihe iwu Chineke nēkwu, ọ nāgwa ndi nọ n'okpuru iwu ahu; ka ewe kpuchita ọnu nile n'otù n'otù, ka ewe kwe na ikpé mara uwa nile n'ebe Chineke nọ:


ka O we gosi ezi omume-Ya n'oge di ub͕u a, ka m'kwuru: ka Ya onwe-ya we buru onye ezi omume, buru kwa onye nāgu onye ahu n'onye ezi omume, bú onye nọ n'okwukwe ekwere na Jisus.


N'ihi na asi na aguru Abraham n'onye ezi omume site n'ọlu, o nwere ihe inya isi; ma ọ bughi n'ebe Chineke nọ.


Ya mere ahurum iwu a, na ihe ọjọ dim nso n'ebe akam gēru, mu, bú onye nāchọ ime ihe ọma.


ma anamahu iwu di iche n'ihe nile dim n'aru, nēbu agha megide iwu nke uchem, nādọtakwam n'agha nye iwu nke nmehie nke di n'ihe nile dim n'aru.


Ma ekele diri Chineke na ndọputa sitere n'aka Jisus Kraist Onye-nwe-ayi. Ya mere otú a mu onwem ji uchem buru orù nke iwu Chineke; ma ejim anu-arum buru orù nke iwu nmehie.


N'ihi na iwu nke Mọ nke ndu nime Kraist Jisus mere ka m'pua n'aka iwu nke nmehie na nke ọnwu, nwere onwem.


n'ihi na mb͕e akāmughi umu ahu, mb͕e ha akēmeghi kwa ihe ọ bula, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe nādighi nma, ka ihe Chineke zubere dika nrọputa si di we digide, o siteghi n'ọlu, kama o sitere n'Onye nākpọ,


ma Israel, ọ bu ezie na ha nāb͕aso iwu ezi omume, ma ha ekwudoghi iwu ahu.


N'ìhi gini? N'ihi na ha esiteghi n'okwukwe chọ ya, kama dika agāsi na ha sitere n'ọlu chọ ya. Ha suru ngọngọ na nkume nke isu-ngọngọ-ha;


N'ihi na Ònye nākpa ókè n'etiti gi na madu-ibe-gi? ọ̀ bu gini kwa ka i nwere nke i nānataghi? ma ọ buru na i natara ya, gini mere i nānya isi, dika agāsi na i nataghi ya?


ma ebe ayi matara na agughi madu n'onye ezi omume site n'ọlu di iche iche nke iwu, ma ọ bu nání okwukwe ekwere na Jisus Kraist ka eji gu madu n'onye ezi omume, ọbuná ayi onwe-ayi kwere na Kraist Jisus, ka ewe gua ayi na ndi ezi omume site n'okwukwe ayi kwere na Kraist, ọ bughi kwa site n'ọlu di iche iche nke iwu: n'ihi na site n'ọlu di iche iche nke iwu ọ dighi anu-aru ọ bula, bú madu, agāgu n'onye ezi omume.


Otú ọ di, ihe edeworo n'akwukwọ nsọ mechibidoro ihe nile n'okpuru nmehie, ka ewe were nkwa ahu nke sitere n'okwukwe ekwere na Jisus Kraist nye ndi kwere ekwe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan