Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 3:2 - Bible Nso

2 Ọ bara urù ri nne n'uzọ nile: mbu, na ewere okwu si n'ọnu Chineke puta nye ha n'aka na ntukwasi-obi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ọ bara uru nʼụzọ niile. Nke mbụ, ọ bụ ndị Juu ka e weere okwu Chineke nyefee nʼaka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 3:2
29 Iomraidhean Croise  

Ihe anuchara anucha nke-uku ka okwu-ọnu-Gi bu; Orù-Gi ahuwo kwa ya n'anya.


Ayi diri iwu, di-kwa-ra ihe-àmà! ọ buru na ha adighi-ekwu dika okwu a si di, n'ezie ọ dighi chi-ọbubọ diri ha.


Ma otú ọ di, m'gēgosi gi ihe akara àkà n'ihe edere n'akwukwọ nke ezi-okwu: ma ọ dighi otù onye nēme onwe-ya ka ọ di ike n'akukum imegide ndia, ma-ọbughi nání Maikael, bú onye-isi ūnu.


Unu nēnyocha ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, n'ihi na unu onwe-unu nēchè na unu nēnwe ndu ebighi-ebi nime ha; ha onwe-ha bu kwa ihe nāb͕aram àmà;


Nwoke a bu onye nānọri nime nzukọ n'ọhia, ya na mọ-ozi ahu nke gwara ya okwu n'ugwu Sainai, na nna-ayi-hà: onye nara okwu di ndu nke si n'ọnu Chineke puta inye ayi:


nke O buru uzọ kwere na nkwa site n'ọnu ndi-amuma-Ya n'ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ,


nāma kwa ihe Ọ nāchọ, nānwa kwa ihe ha na ibe-ha di iche, ebe anēwere okwu-ọnu zí gi ihe site n'iwu-gi,


Gini kwa ka onye-Ju nwebigara ókè? ma-ọbu ùrù gini ka ibì-úgwù bara?


N'ihi na asi na ufọdu ekweghi, gini kwa? èkweghi-ekwe-ha gēme ka ikwesi-ntukwasi-obi nke Chineke ghara idi irè?


ebe ha bu ndi Israel; ndi nwe ido-ka-nwa-nwoke ahu, na ebube ahu, na ọb͕ub͕a-ndu nile, na inye-iwu ahu, na ikpe ekpere ahu n'ulo uku Chineke, na nkwa nile;


N'ihi na asi na emem ihe a ebe m'nāchọ ime ya, enwerem ugwọ-ọlu: ma ọ buru na emem ya mb͕e m'nāchọghi ime ya, ewerewo ntukwasi-obi nye ọchichi-èzí-na-ulo n'akam.


nke bu na Chineke nọri nime Kraist nēme ka Ya onwe-ya na uwa di n'otù, nāgughi ndahie nile ha megide ha, O debe-kwa-ra nime ayi okwu nke ime-ka-adi-n'otù ahu.


kama n'akuku ọzọ, mb͕e ha huru na enyereri ozi ọma nke ndi ebìghi-úgwù n'akam na ntukwasi-obi idebe, dika enyereri Pita ozi ọma nke ndi obibi-úgwù n'aka idebe


Biko Timọti, nēche ihe ahu enyere gi n'aka idebe, nēze okwu efu nile nke emeruru emeru nke ihe ahu anākpọ ihe-ọmuma n'uzọ ugha, ha na nguzogide-ya nile;


N'ihi na mb͕e unu kwesiri ibu ndi-ozizí n'ihi oge, ọ di unu nkpà ọzọ ka madu zí unu ihe bu ihe-ozizí mbu nke nmalite okwu si n'ọnu Chineke puta; unu aghọwo kwa ndi miri-ara di nkpà, ọ bughi nri siri ike.


ọ buru na onye ọ bula nēkwu okwu, ya kwue dika okwu nke si Chineke n'ọnu puta; ọ buru na onye ọ bula nēje ozi, ya je dika o sitere n'ike ahu Chineke nēnyezu: ka ewe nye Chineke otuto n'ihe nile site n'aka Jisus Kraist, Onye nwe ebube nile na ike nile rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


M'we da n'ala n'iru ukwu-ya ikpọ isi ala nye ya. O we sim, Lezi anya ka i ghara ime ya: abum orù-ibe-gi, buru kwa orù-ibe nke umu-nna-gi nke nwere àmà nke Jisus: kpọ isi ala nye Chineke: n'ihi na àmà nke Jisus bu mọ nke amuma.


O we sim, Okwu ndia kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa ezi-okwu: Onye-nwe-ayi, bú Chineke nke ndi-mọ nke ndi-amuma, zite-kwa-ra mọ-ozi-Ya igosi ndi-orù-Ya ihe nile nāghaghi iputa na mb͕e ntà.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan