17 Uzọ udo ka ha nāmaghi kwa:
17 Ha amaghị ihe bụ ụzọ udo.
Ọ dighi udo ndi nēmebi iwu nwere, ka Chinekem siri.
Uzọ udo ka ha nāmaghi; ọ dighi kwa ikpé ziri ezi di n'uzọ nile ha: ha emewo ka okporo-uzọ nile ha b͕agọrọ ha ab͕agọ; onye ọ bula nke nāzọ ije na ya adighi-ama udo.
N'ihi na warara ka ọnu-uzọ ahu di, nkpagide ka uzọ ahu di kwa, nke nēdubà na ndu, ole-na-ole ka ha di kwa, bú ndi nāchọta ya.
Imukwasi ndi nọ n'ọchichiri na onyinyo ọnwu ìhè; Iduzi ukwu-ayi ba n'uzo udo.
Nbibi na ihuju-anya di n'uzọ nile ha;
Egwù Chineke adighi n'anya-ha.
Ya mere ebe aguru ayi na ndi ezi omume site n'okwukwe, ayi na Chineke di n'udo site n'aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist;