14 Ndi ọnu-ha juru n'ọb͕ub͕a-iyi na ihe-ilu:
14 Ọnụ ha jupụtara nʼokwu na-akụ ilu na ọbụbụ ọnụ.
Ọnu-ya juputara n'ọb͕ub͕a-iyi na aghughọ na mmegbu: N'okpuru ire-ya ka nmeb͕u na ajọ ihe di.
Nmehie nke ọnu-ha ka okwu nke eb͕ub͕ere-ọnu-ha bu; Ka anwude kwa ha nime npako-ha, Na n'ihi ọb͕ub͕a-iyi na n'ihi okwu-ugha nke ha nākọ akukọ-ha.
Ka ewepu ihe-ilu na ọnuma na iwe na iti-nkpu na nkwulu nile, ha na obi ọjọ nile, n'etiti unu:
n'otù ọnu ahu ka ngọzi na ọbubu-ọnu si puta. Umu-nnam, o kwesighi ka ihe ndia di otú a.