Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 3:10 - Bible Nso

10 dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ọ dighi onye bu onye ezi omume, ọ dighi otù onye ma-ọli;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Dịka e dere ya, “Ọ dịghị onye ọbụla bụ onye ezi omume, ọ dịghị ọ bụladị otu onye.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 3:10
29 Iomraidhean Croise  

Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ihe ọcha gāputa n'ihe ruru árú! ọ dighi otù ihe ọcha gāputa na ya.


Gini ka madu bu, na ọ gādi ọcha n'obi, Na ọ gābu kwa onye ezi omume, bú onye nwayi muru?


Ònye-árú nke b͕aruru ab͕aru dika miri gēsi kwa aṅa di ọcha n'anya-Ya, Bú madu nke nāṅu ajọ omume dika miri?


Màdu gēsi kwa aṅa buru onye ezi omume n'iru Chineke? Ma-ọbu, ò gēsi aṅa di ọcha n'obi, bú onye nwayi muru?


Eji-kwa-la orù-Gi ba n'ikpé; N'ihi na ọ dighi onye ọ bula nke di ndu bu onye ezi omume n'iru Gi.


Ayi diri iwu, di-kwa-ra ihe-àmà! ọ buru na ha adighi-ekwu dika okwu a si di, n'ezie ọ dighi chi-ọbubọ diri ha.


Obi di aghughọ kari ihe nile, ihe nādighi ngwọta ka ọ bu kwa: ònye gāmara ya?


N'ihi na n'obi ka ajọ èchìchè nile, ib͕u-madu nile, ikwa-iko nile nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, ikwa-iko nile, ori nile, àmà ugha nile, nkwulú nile, si aputa:


Ma Jisus siri ya, Gini mere i nākpọm ezi onye? ọ dighi onye ọ bula bu ezi onye ma-ọbughi otù Onye, bú Chineke.


dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Chineke nyere ha mọ nke oké ura, anya ighara ihu uzọ, na nti ighara inu ihe, rue ubọchi ta.


Ọ dighi onye nāghọta, Ọ dighi onye nāchọ Chineke;


n'ihi na madu nile emehiewo, ha adighi-eru kwa otuto Chineke;


Chineke ekwela: kama ka ọ puta ihè na Chineke bu Onye ezi-okwu, ma madu nile n'otù n'otù bu ndi-ugha; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ka ewe gua Gi n'onye ezi omume n'okwu-Gi nile, Ka I we kpeb͕u kwa mb͕e anēkpe Gi ikpé.


N'ihi na ayi onwe-ayi buru kwa ndi nēnweghi uche n'oge gara aga, ndi nēkweyeghi, ndi anēduhie, ndi bu orù agu ihe ọjọ na ihe-utọ di iche iche, nēbi n'obi ọjọ na ekworo, ndi-ùrú, nākpọrita ibe-ayi asì.


n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Unu gādi nsọ; n'ihi na nsọ ka Mu onwem di.


Ma ndi nātu ujọ, na ndi nēkweghi ekwe, na ndi-árú, na ndi-ob͕u-madu, na ndi nākwa iko, na ndi nāgwọ ńsí, na ndi nēkpere arusi, na ndi-ugha nile, òkè-ha gābu nime ọdọ ahu nke ji ọku na brimstone nēre; nke bu ọnwu nke-abua ahu.


N'azu obodo ka ha di, bú nkita nile, na ndi nile nāgwọ nsi, na ndi nile nākwa iko, na ndi-ob͕u-madu nile, na ndi nēkpere arusi, na onye ọ bula nke nāhu ugha n'anya nēme kwa ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan