Ma ub͕u a ka oké egwu Jehova dikwasi unu; lezienu anya, me ya: n'ihi na ọ dighi ajọ omume, ma-ọbu ihu-madu-iru-ọma, ma-ọbu inara-ihe-iri-ngo, di nime Jehova, bú Chineke-ayi.
Ha we zigara Ya ndi nēso uzọ-ha, ha na ndi Herod, si, Onye-ozizí, ayi amatawo na I bu onye ezi-okwu, na I nēzí kwa uzọ Chineke n'ezi-okwu, na I dighi-asọ kwa onye ọ bula anya: n'ihi na I dighi-ele madu anya n'iru.
Ma site n'ọnu ndi akpọrọ ihe (aha madu ha buri n'oge gara aga, o meghi ihe di iche n'anyam: Chineke adighi-ele madu anya n'iru) asim, na ndi ahu akpọrọ ihe enyeghm ìzù ọ bula:
Ndi-nwe madu, nēme-kwa-ranu ha otù ihe ahu, nārapu iba-nba-unu: ebe unu matara na Onye-nwe ma ha ma unu nọ n'elu-igwe, ile-madu-anya-n'iru adighi kwa n'ebe Ọ nọ.
N'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu Chineke kachasi chi nile, na Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile, Chineke uku ahu, bú dike, di kwa egwu, Onye nāhughi madu iru-ọma n'ikpé, Onye nānaraghi ihe-iri-ngo.
Ewezugala ikpé; amatala iru madu n'ikpé: anara-kwa-la ihe-iri-ngo; n'ihi na ihe-iri-ngo nēme ka anya ndi mara ihe kpu ìsì, ọ nēme kwa ka okwu nile nke ndi ezi omume b͕agọ ab͕agọ.
Ọ buru kwa na unu akpọku Ya dika Nna, bú Onye nēkpe ikpé dika ọlu madu nile n'otù n'otù si di nēleghi madu anya n'iru, nēbinu obi n'egwu n'oge unu bi dika ọbìa: