Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 16:4 - Bible Nso

4 madu ndi tọb͕ọrọ olu nke aka ha n'ihi ndum; ndi ọ bughi nání mu onwem nēkele, kama nzukọ Kraist nile nke ndi mba ọzọ kwa:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ndị a atụghị egwu ọnwụ nʼihi ndụ m. Ọ bụghị naanị mụ onwe m na ekele ha, kama nzukọ Kraịst ndị dị na mba ọzọ niile na-ekelekwa ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 16:4
17 Iomraidhean Croise  

Ndi-irom, I nyewokwam olu-ha, Ndi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha.


N'ihi nka ka Jehova siri otú a: Le, M'nēchè èchìchè ihe ọjọ megide ab͕uru nka, bú ihe ọjọ nke unu nāgaghi-ekopu olu-unu, unu agaghi-ejeghari kwa n'idi-elu; n'ihi na mb͕e ọjọ ka ọ bu.


Ọ dighi onye ọ bula nwere ihu-n'anya kari nka uku, ka madu tọb͕ọ ndu-ya n'ihi ndi-enyì-ya.


ndi raraworo ndu-ha nye n'ihi aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.


O we gabiga nime Siria na Silisia, nēme ka nzukọ Kraist guzosie ike.


Ya mere anēnye nzukọ Kraist ike n'okwukwe-ayi, ọnu-ọgugu-ha nābabiga kwa uba ókè kwa-ubọchi.


Ya mere nzukọ Kraist nime Judia na Galili na Sameria dum nwere udo, ebe anēwuli ya elu dika ulo; ọ nāba kwa uba, ebe ọ nāga n'egwu Onye-nwe-ayi na nkasi-obi nke Mọ Nsọ.


Kelenu Priska na Akwila ndi mu na ha nālukọ ọlu nime Kraist Jisus,


kele-kwa-nu nzukọ Kraist nke di n'ulo-ha. Kelenu Epinetọs onye m'huru n'anya, onye bu nkpuru mbu nke Esia nye Kraist.


N'ihi na ọ di ike na otù onye gānwu n'ihi onye ezi omume: n'ihi na ma eleghi anya otù onye gēnwe anya-ike ọbuná inwu n'ihi ezi madu.


Ma okwu bayere ùtú anāturu ndi nsọ, dika m'nyere nzukọ Kraist di na Galetia iwu, unu onwe-unu me kwa otú a.


Ọ bu nání, dika Onye-nwe-ayi kèworo nye onye ọ bula, dika Chineke kpọworo onye ọ bula, ya jegharia otú a. Otú a ka m'nāka kwa àkà nime nzukọ Kraist nile.


n'ihi na ọ bu n'ihi ọlu Kraist ka ọ biaruru ọnwu nso, nēkwere itufu ndu-ya, ka o we mezu ihe fọduru unu ime n'ifè-òfùfè-unu n'ebe m'nọ.


N'ihi na unu onwe-unu, umu-nna-ayi, ghọrọ ndi nēṅomi nzukọ nile nke Chineke nke di na Judia nime Kraist Jisus: n'ihi na unu onwe-unu hu-kwa-ra otù ahuhu ahu n'aka ndi unu na ha bu otù ala, ọbuná dika ndi ahu huru ahuhu n'aka ndi-Ju;


O rue, mb͕e ha mere ka eze ise ahu pukute Joshua, na Joshua kpọrọ ndikom nile nke Israel, si ndi-ọchi-agha nke ndikom agha ndi soro ya je, Bianu nso, zọkwasinu ukwu-unu n'olu eze ndia. Ha we bia nso, zọkwasi ukwu-ha n'olu-ha.


Nime nka ka ayi maworo ihu-n'anya, n'ihi na Ya onwe-ya tọb͕ọrọ ndu-Ya n'ihi ayi: ayi onwe-ayi ji kwa ugwọ itọb͕ọ ndu-ayi n'ihi umu-nna-ayi.


Jọn nēdegara nzukọ Kraist asa nke di n'Esia akwukwọ: Amara diri unu, ya na udo, nke si n'aka Onye ahu puta, bú Onye nādi adi, Onye dikwari, Onye nābia kwa; nke si kwa n'aka Mọ asa ahu puta, bú ndi nọ n'iru oche-eze-Ya;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan