Kelenu Andrọnaikọs na Junias, ndi-ikwum, ndi adọkọ-kwa-ra mu na ha n'agha, madu ndi amara aha-ha n'etiti ndi-ozi, ndi bu-kwa-ram uzọ bia nọ nime Kraist.
Ma ọ buru na Mọ nke Onye ahu Nke mere ka Jisus si na ndi nwuru anwu bilie nēbi nime unu, Onye ahu Nke mere ka Kraist Jisus si na ndi nwuru anwu bilie gēsite kwa n'aka Mọ-Ya Nke nēbi nime unu me ka aru-unu nke puru inwu anwu di ndu.
Amataram otù madu nime Kraist, arọ iri na anọ gara aga (ma ọ bu nime aru, amataghi m; ma-ọbu na ọ bughi nime aru, amataghm; Chineke matara), na eweliri madu di otú a na mberede rue elu-igwe nke-atọ.
Ma anamagu ya ihe di nkpà izigara unu Epafrọdaitọs, bú nwa nna m na onye mu na ya nālukọ ọlu, onye mu na ya nēbukọ kwa agha, onye buru kwa onye-ozi-unu na onye nēfè òfùfè ib͕o nkpàm;
Jisus kwa, onye anākpọ Justọs, madu atọ ndia sitere n'obibì-úgwù: nání ndia bu ndi sorom nālukọ ọlu n'ikwusa ala-eze Chineke, madu ndi emere ka ha burum ndi-ngugù-obi.