Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 16:21 - Bible Nso

21 Timọti onye mu na ya nālukọ ọlu nēkele unu; na Lusiọs na Jeson na Sosipata, ndi-ikwum.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Timoti onye so m na-arụkọ ọrụ, na Lusiọs, na Jesin na Sosipata, ndị ikwu m na-ekele unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 16:21
24 Iomraidhean Croise  

Ma ndi-amuma na ndi-ozizí di n'Antiọk, nime nzukọ Kraist di n'ebe ahu, bú Banabas, na Simeon onye anākpọ Naiga, na Lusiọs onye Sairini, na Manaen onye azùkọrọ ya na Herod, bú tetrarch, na Sọl.


Mb͕e ahu umu-nna nime Kraist we zipu Pọl ngwa ngwa iga rue oké osimiri: ma Sailas na Timọti nọgidere n'ebe ahu.


Ma ndi-Ju, ebe ha nēkwo ekworo, ha kuru ajọ ndikom ufọdu nime ndi nēguzo n'efu n'ọma-ahia ka ha so ha, ha we kpọkọta ìgwè madu, me ka obodo ahu tua ùzù; ha we biakwasi ulo Jeson, chọ uzọ ikuputa ha n'iru ọra madu.


Ma mb͕e Sailas na Timọti si na Masedọnia ridata, okwu Chineke nēb͕u Pọl nb͕u n'obi, ọ nāgwasi ndi-Ju ike na Jisus bu Kraist-ha.


Mb͕e o zigasiri na Masedọnia madu abua nime ndi nējere ya ozi, bú Timọti na Erastọs, ya onwe-ya we nọdu n'Esia nwa oge.


Sopata, nwa Pirọs, onye Beria, we so ya; ya na Aristakọs na Sekundọs, nime ndi Tesalọnaika; na Gaiọs nke Dabe, na Timọti, na Tikikọs na Trọfimọs, bú ndi Esia.


Kelenu Hirọdion onye-ikwum. Kelenu ndi sitere n'èzi-na-ulo nke Nasisọs, ndi nọ nime Onye-nwe-ayi.


Kelenu Andrọnaikọs na Junias, ndi-ikwum, ndi adọkọ-kwa-ra mu na ha n'agha, madu ndi amara aha-ha n'etiti ndi-ozi, ndi bu-kwa-ram uzọ bia nọ nime Kraist.


N'ihi na anamekperi ekpere, ka mu onwem buru anathema pua n'ebe Kraist nọ n'ihi umu-nnem, ndi-ikwum dika anu-aru si di:


Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n'ọchichọ Chineke, na Timọti nwa-nna-ayi, nēdegara nzukọ Chineke nke di na Kọrint akwukwọ, ha na ndi nsọ nile ndi nọ n'Akaia dum:


N'ihi na Ọkpara Chineke, Jisus Kraist, Onye ekwusara n'etiti unu site n'ọnu-ayi, bú site n'ọnu nkem na nke Silvanọs na nke Timọti, emeghi Ya ka Ọ buru e na é-è, kama emewo ka e di nime Ya.


Pọl na Timọti, ndi-orù nke Kraist Jisus, nēdegara ndi nsọ nile nime Kraist Jisus ndi nọ na Filipai akwukwọ, ha na ndi nēlekọta unu anya na ndi nējere unu ozi:


Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n'ọchichọ Chineke, na Timọti nwa-nna-ayi,


Pọl na Silvanọs na Timọti nēdegara nzukọ nke ndi Tesalọnaika nime Chineke, bú Nna, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, akwukwọ: Amara diri unu, ya na udo.


ayi we ziga Timọti, nwa-nna-ayi na onye nējere Chineke ozi n'ozi ọma nke Kraist, ka o we me ka unu guzosie ike, ka o we kasi kwa unu obi n'ihi okwukwe-unu;


Ma mb͕e Timọti siri n'ebe unu nọ biakute ayi ọbuná ub͕u a, we zìe ayi ozi ọma bayere okwukwe na ihunanya unu, si kwa na unu nēcheta ayi ezi ncheta mb͕e nile, na agu ihu ayi anya nāgusi kwa unu ike, ọbuná dika ọ nāgu kwa ayi onwe-ayi ihu unu;


Pọl na Silvanọs na Timọti nēdegara nzukọ nke ndi Tesalọnaika nime Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, akwukwọ:


anamedegara Timọti akwukwọ, bú ezi nwam n'okwukwe: Amara na ebere na udo diri gi nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Kraist Jisus Onye-nwe-ayi puta.


Ma gi onwe-gi, onye nke Chineke, nāb͕anari ihe ndia; ma nāb͕aso ezi omume, nsọpuru-Chineke, okwukwe, ihu-n'anya, ntachi-obi, idi-nwayọ.


Biko Timọti, nēche ihe ahu enyere gi n'aka idebe, nēze okwu efu nile nke emeruru emeru nke ihe ahu anākpọ ihe-ọmuma n'uzọ ugha, ha na nguzogide-ya nile;


nēdegara Timọti akwukwọ, bú nwam nke m'huru n'anya: Amara na ebere na udo diri gi, nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Kraist Jisus Onye-nwe-ayi puta.


Maranu na arapuwo nwa-nna-ayi Timọti ka ọ la; ọ buru kwa na ọ gābia na mb͕e ntà, mu na Ya gāhu unu anya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan