Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 16:20 - Bible Nso

20 Ma Chineke nke udo gāzọpia Setan n'okpuru ukwu-unu ọsọsọ. Amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Mgbe na-adịghị anya, Chineke nke udo ga-azọpịa ekwensu nʼokpuru ụkwụ unu. Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 16:20
26 Iomraidhean Croise  

iro ka M'gētiye kwa n'etiti gi na nwayi ahu, na n'etiti nkpuru-gi na nkpuru-ya: nkpuru ahu gēchifia gi n'isi, gi onwe-gi gēchifia kwa ya n'ikiri-ukwu.


Hu onye-npako ọ bula, me ka o ruru ala; Zọpia kwa ndi nēmebi iwu n'ọnọdu-ha.


Ebe-nzọcha-nkpuru-vine ka M'zọchara, náním; ma nime ndi nile di iche iche ọ dighi onye ọ bula Mu na ya nọ: M'we zọcha ha n'iwem, zọda ha n'ọnumam; ọbara-ndu-ha we fesa n'uwem nile, ọ bu kwa uwe-oyiyim nile ka M'meruru emeru.


Ha gādi kwa ka ndi-dike, nāzọda ndi-iro-ha n'apiti èzí nile n'agha; ha gēbu kwa agha, n'ihi na Jehova nọyere ha: ihere gēme kwa ndi nānọkwasi inyinya.


Unu gāzọda kwa ndi nēmebi iwu; n'ihi na ha gābu ntu n'okpuru ọbu-ukwu-unu n'ubọchi ahu mḅe M'gēme ihe, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Mb͕e ahu Jisus siri ya, Laba, Setan: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye-nwe-ayi Chineke-gi ka i gākpọ isi ala nye, ọ bu kwa nání Ya ka i gēkpere.


Le, enyewom unu ike izọkwasi agwọ na akpi ukwu, na imegide ike onye-iro-unu nile: ọ dighi kwa ihe ọ bula gēmeru unu aru ma-ọli.


Ma ka Chineke nke udo nọyere unu nile. Amen.


Gaiọs, onye nēlem na nzukọ Kraist dum ọbìa, nēkele unu. Erastọs onye nāchi ihe obodo nēkele unu, na Kwọtọs nwa-nna-ayi.


Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere unu nile. Amen.


É-è, kama n'ihe ndia nile ayi nēmeribiga ókè site n'aka Onye ahu Nke huru ayi n'anya.


Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere unu.


Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na ihu-n'anya nke Chineke, na nnwekọ nke Mọ Nsọ, diyere unu nile.


Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere mọ-unu, umu-nnam. Amen.


Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist dinyere mọ-unu.


Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist dinyere unu.


Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist dinyere unu nile.


Ka Onye-nwe-ayi nọyere mọ nke gi. Ka amara dinyere unu.


Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere mọ-unu. Amen.


onye nēme nmehie si n'ekwensu puta; n'ihi na ekwensu nēmehie site na mbu. Ihe eji me ka Ọkpara Chineke puta ìhè bu nka, ka O we la ọlu nile nke ekwensu n'iyì.


M'we nu oké olu ka ọ nādà n'elu-igwe, si, Ub͕u a ka ọ biaworo, bú nzọputa ahu, na ike ahu, na ala-eze Chineke-ayi, na ichi-isi nke Kraist-Ya: n'ihi na achudara onye ahu nke nēbo umu-nna-ayi ebubo, onye nēbo ha ebubo n'iru Chineke-ayi ehihie na abali.


Ka amara Onye-nwe-ayi Jisus diyere ndi nsọ nile. Amen.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan