Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 16:2 - Bible Nso

2 ka unu we nara ya nke-ọma nime Onye-nwe-ayi, dika o kwesiri ndi nsọ, ka unu nēguzo kwa ya nso iyere ya aka n'okwu ọ bula nkpà unu gākpa ya: n'ihi na ya onwe-ya aburuwo kwa onye nēguzoro ọtutu madu izọ ha, mu onwem kwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Biko nabatanụ ya nʼime Onyenwe anyị dịka o kwesiri ndị ya. Nyekwaranụ ya aka nʼụzọ niile unu nwere ike, nʼihi na o nyerela mụ na ọtụtụ ndị ọzọ aka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 16:2
25 Iomraidhean Croise  

Eze ahu gāza kwa, si ha, N'ezie asim unu, Ka ọ ra, bú otú unu si me ya nye otù onye nime umu-nnam ndia, bú ndi dikarisiri ntà, Mu ka unu mere ya nye.


Ma Ananaias zara, si, Onye-nwe-ayi, anurum n'ọnu ọtutu madu ihe bayere nwoke a, ka ha ra, bú ajọ ihe o mere ndi nsọ Gi na Jerusalem:


Ma Onye-nwe-ayi siri ya, Ga: n'ihi na onye ahu bu ihe-ọlu arọputara nyem, ka o buru aham che n'iru mba ọzọ na ndi-eze, na umu Israel:


Ma otù nwanyi nke nēso uzọ Jisus nọ na Jọpa, aha-ya bu Tabita, nke anākpọ Dọkas, ma asugharia ya: nwanyi a juputara n'ezi ọlu na ọlu ebere nke ọ nēme.


Pita we bilie so ha je. Ma mb͕e ọ biaruru, ha duru ya rigo n'ime-ulo ahu di n'elu ulo: ndinyom nile ndi di-ha nwuru guzo-kwa-ra ya nso nākwa ákwá, nēgosi kwa uwe-ime na uwe ọzọ, ka ha ra, bú nke Dọkas nēme mb͕e ya na ha nọ.


O we nye ya aka-ya, palie ya elu; mb͕e ọ kpọsiri ndi nsọ na ndinyom ndi di-ha nwuru, ọ che ya na ndu n'iru ha.


N'ihi ya nākpọbatanu ibe-unu, dika Kraist-ayi kpọbata-kwa-ra unu, ka ewe nye Chineke otuto.


Kelenu Filọlọgọs na Julia, Nireọs na nwa-nne-ya nwayi, na Ọlimpas, na ndi nsọ nile ndi ha na ha nọ.


Gaiọs, onye nēlem na nzukọ Kraist dum ọbìa, nēkele unu. Erastọs onye nāchi ihe obodo nēkele unu, na Kwọtọs nwa-nna-ayi.


Kelenu Meri, n'ihi na ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu n'ọtutu ihe nye unu.


Kelenu Uabenọs, onye ayi na ya nālukọ ọlu nime Kraist, na Stakis onye m'huru n'anya.


Ma ikwa-iko, na adighi-ọcha nile, ma-ọbu anya-uku, ka aghara ikpọ ọbuná aha-ya n'etiti unu, dika o kwesiri ndi nsọ;


Nání nēbinu obi dika ndi ala elu-igwe n'uzọ kwesiri ozi ọma nke Kraist: ka ọ gābu, ma m'bia hu unu ma-ọbu na anọghm, ka m'we nu ihe bayere ọnọdu-unu, na unu nēguzosi ike n'otù Mọ Nsọ, nēwere kwa otù nkpuru-obi lukọrọ okwukwe nke ozi ọma ahu ọ̀gù si-ike;


Ya mere werenu ọṅù nile nara ya nke-ọma nime Onye-nwe-ayi; nāsọpuru-kwa-nu ndi di otú a:


Aristakọs onye adọkọrọ mu na ya n'agha nēkele unu, ya na Mak nwa-nne Banabas (onye unu natara ihe ufọdu enyere n'iwu bayere ya; asi na ọ biakute unu, naranu ya nke-ọma),


kama (nke kwesiri ndinyom nēkwuputa egwu Chineke) ka ha site n'ezi ọlu chọ onwe-ha nma.


(ka Onye-nwe-ayi nye ya ka ọ chọta ebere n'aka Onye-nwe-ayi n'ubọchi ahu); ka ha ra kwa, bú ihe o ji jere m ozi n'Efesọs, gi onwe-gi jere karia.


otú ahu ka agadi-ndinyom di nsọ n'omume-ha, ghara ibu ndi nēbo ebubo ugha, ghara kwa ibu orù nke iṅubiga manya ókè, ka ha buru ndi nēzí ihe ọma;


onye m'nēzighachiri gi, ya onye-ya, nke ahu bu, obi nkem:


Ya mere ọ buru na i gurum n'onye-nnwekọ, nara ya nke-ọma dika mu onwem.


Ọ buru na onye ọ bula abiakute unu, ma ọ wetaghi ozizí a, unu akpọbatala ya n'ulo, unu asi-kwa-la ya biri nke-ọma:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan