Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 16:1 - Bible Nso

1 Ma anameme ka unu mara Fibi nwa-nna-ayi nwanyi, onye nējere nzukọ Kraist nke di na Kenkrii ozi:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Ana m eme ka unu mata nwanna anyị nwanyị, Fibi, onye na-ejere nzukọ ozi na chọọchị dị nʼobodo Senkria.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 16:1
10 Iomraidhean Croise  

N'ihi na onye ọ bula nke gēme ihe Nnam Nke bi n'elu-igwe nāchọ, onye ahu bu nwa-nnem nwoke, na nwa-nnem nwanyi, na nnem.


ma-ọbughi na ọ gānata ọgu ise ọgu ise ub͕u a n'oge a, ulo, na umu-nne-ndikom, na umu-nne-ndinyom, na nne, na umu, na ubi, ha na nsob͕u; ọ gānata kwa ndu ebighi-ebi n'oge nke nābia.


na Joana nwunye Kuza onye Herod tiyere ihe-ya n'aka, na Susana, na ọtutu ndi ọzọ, ndi nēweputa ihe ha nwere ime ezi ha.


Mb͕e Pọl nọgidesiri ọtutu ubọchi ọzọ, ọ kele umu-nna nime Kraist ekele ikpe-azu, we si n'ebe ahu ba n'ub͕ọ ije Siria, Prisila na Akwila soro kwa ya; mb͕e ọ kpachasiri agiri-isi-ya na Kenkrei: n'ihi na ọ kwereri Chineke nkwa.


Àyi nāmalite ọzọ ime ka madu mara ayi? ma-ọbu ǹkpà akwukwọ-ozi ime ka madu mara ayi nākpa ayi inye unu ma-ọbu inara unu, dika ọ nākpa ufọdu?


ndinyom, ndi bu okenye, dika ndi bu nne; umu-ab͕ọghọ dika umu-nne-nwanyi, n'idi-ọcha nile.


nēdega-kwa-ra Apfia nwa-nna-ayi nwanyi, na Akipọs onye ayi na ya nēbukọ agha, na nzukọ Kraist di n'ulo-gi:


Ọ buru na nwa-nna-nwoke ma-ọbu nwa-nna-nwanyi b͕a ọtọ, nēnweghi kwa ihe-oriri gēzuru ya kwa-ubọchi,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan