Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 15:19 - Bible Nso

19 n'ike nke ihe-iriba-ama na ọlu-ebube di iche iche, n'ike nke Mọ Nsọ; ya mere site na Jerusalem, na ala nke di ya gburugburu rue Ilirikọm, ezìzuwom ozi ọma Kraist;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 nke pụtara ihe nʼọrụ ebube na ihe ịrịbama site nʼike nke Mmụọ nke Chineke. Ya mere, site na Jerusalem ruo Ilirikom, ekwusaala m nʼụzọ zuru ezu, oziọma Kraịst.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 15:19
37 Iomraidhean Croise  

Ma ọ buru na Mu onwem achupu ndi-mọ ọjọ n'ike Mọ nke Chineke, ya mere ala-eze Chineke ruru unu aru.


Ya mere Jisus siri ya, Ọ buru na unu ahughi ihe-iriba-ama na ọlu-ebube, unu agaghi-ekwe ma-ọli.


Ma unu gānata ike, mb͕e Mọ Nsọ gābiakwasiwori unu: unu gābu kwa ndi-àmàmnime Jerusalem, na nime Judia na Sameria nile, ru kwa ebe uwa sọturu.


Ma ha onwe-ha sitere na Paga gabiga, bia rue Antiọk di na Pisidia; ha we ba nime ulo-nzukọ-ha n'ubọchi-izu-ike, we nọdu ala.


Ma ha rupuru ájá nke ukwu-ha megide ha, we bia rue Aikọniọm.


o were oké olu si, Bilie, guzo ọtọ n'ukwu-gi abua. O we wulie je kwa ije.


Ma mb͕e ndi nēso uzọ Jisus guzoro ya buruburu, o bilie, ba nime obodo: n'echi-ya ya na Banabas we pua ga Dabe.


Mb͕e ha kwusiri okwu Chineke na Paga, ha ridata n'Atalaia;


ha we mata, b͕alaga n'obodo nke Laikaọnia, bú Listra na Dabe, na ala di ha buruburu:


Ọra ha nile we kpuchie ọnu-ha; ha we nuru okwu Banabas na Pọl ka ha nakọ akukọ ihe-iriba-ama na ọlu-ebube nile, ka ha ra, bú nke Chineke mere n'etiti ndi mba ọzọ site n'aka-ha.


Ma nka ka ọ nēme ọtutu ubọchi. Ma Pọl, ebe ike gwuru ya nọ̄, o chighariri, si mọ ahu, Anamenye gi iwu n'aha Jisus Kraist ka i si nime ya puta. O we puta n'otù oge hour ahu.


Ngwa ngwa umu-nna nime Kraist we zipu Pọl na Sailas n'abali igaru Beria: mb͕e ha ruru ebe ahu, ha ba nime ulo-nzukọ nke ndi-Ju.


Ma ndi duru Pọl kuru ya rue Atens: mb͕e ha natasiri iwu inye Sailas na Timọti ka ha biakute ya ọsọsọ ka ike-ha ra, ha we la.


Mb͕e ihe ndia gasiri o si n'Atens pua, bia rue Kọrint.


Ha we rue Efesọs, o we rapu ha n'ebe ahu: ma ya onwe-ya batara n'ulo-nzukọ-ha, we gwa ndi-Ju okwu.


O we rue mb͕e Apọlos nọ na Kọrint, na Pọl, mb͕e ọ gabigasiri nime elu ala, ọ biaruru Efesọs, hu madu ufọdu ndi nēso uzọ Jisus:


otú egwu nēmeghm ka m'ghara ikọrọ unu otù ihe n'ihe nile bara unu urù, na izí unu ihe n'iru ọra madu, n'ulo nke aka unu kwa n'otù n'otù,


Ayi onwe-ayi we si na Filipai ba n'ub͕ọ je, mb͕e ubọchi achicha ekoghi-eko gasiri, ayi we biakute ha na Troas ka o ruru ubọchi ise; ebe ayi nọgidere ubọchi asa.


Ma Chineke nke olile-anya ahu mejue unu n'ọṅù nile na udo nile n'ikwe-ekwe, ka unu we nwebiga olile-anya ahu ókè, n'ike Mọ Nsọ.


ka m'we buru onye nēfè Kraist Jisus òfùfè ijekuru ndi mba ọzọ, nālu kwa ọlu onye-nchu-àjà nke ozi ọma Chineke, ka ewe me ka iche-ndi-mba-ọzọ-n'iru-Chineke buru ihe agānara nke-ọma, ebe edoro ya nsọ nime Mọ Nsọ.


mb͕e ọ bula m'gāga Spain (n'ihi na anamele anya na m'gēkiri unu mb͕e m'nāgabiga, anamele kwa anya na unu gēdupum n'ijem iga ebe ahu, ma ọ buru na afọ gēburu uzọ jum n'aru unu n'akuku ufọdu)


Okwum na ihe m'kwusara abughi kwa n'okwu amam-ihe, ime ka madu kweye, kama ha bu na ngosi nke Mọ Nsọ na nke ike:


Ewere ihe-iriba-ama di iche iche na ọlu-ebube na ọlu di ike di iche iche luputa ihe-iriba-ama nile nke onye-ozi n'etiti unu ezie na ntachi-obi nile.


Ya mere Onye ahu Nke nwe inyezu unu Mọ Nsọ, Nke nāluputa kwa ọlu di ike nime unu, Ò sitere n'ọlu di iche iche nke iwu ma-ọbu na o sitere n'ọnunu nke okwukwe nēme ya?


nke emere mu onwem onye nējere ya ozi, dika ọlu ọchichi-èzí-na-ulo nke Chineke si di nke enyerem n'ebe unu nọ, ikwuzu okwu Chineke,


na ọ bughi nání n'okwu-ọnu ka ozi ọma ayi biaruru unu, kama ọ bia-kwa-ra n'ike, na nime Mọ Nsọ na ọtutu nkwezu; dika unu matara aha madu a huru na ayi bu n'ebe unu nọ n'ihi unu.


Ma Onye-nwe-ayi guzorom nso, we me ka m'di ike; ka ewe were ọnum kwusazue nkwusa ahu, ka ndi mba ọzọ nile we nu kwa: ewe dọputam n'ọnu ọdum.


Chineke nēso kwa ha nāb͕akọ àmà, site n'ihe-iriba-ama na ọlu-ebube di iche iche, site kwa n'ọlu ike di iche iche, site kwa n'òkìkè nke Mọ Nsọ, dika ọchichọ nke aka Ya si di.


Ndi ekpughere nye, na ọ bughi onwe-ha, kama ọ bu unu, ka ha ji ihe ndia jere ozi, bú ihe nke akọrọ unu ub͕u a site n'ọnu ndi ahu ndi zìri unu ozi ọma nka nime Mọ Nsọ eziputara n'elu-igwe; ihe ọ nāgu ndi-mọ-ozi inyocha ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan