Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Rom 14:8 - Bible Nso

8 N'ihi na asi na ayi di ndu, ọ bu n'ebe Onye-nwe-ayi nọ ka ayi di ndu; ma asi na ayi nwuru, ọ bu n'ebe Onye-nwe-ayi nọ ka ayi nwuru: ya mere, ma ayi di ndu, ma ayi nwuru anwu, ayi bu ndi nke Onye-nwe-ayi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ọ bụrụ na anyị adịrị ndụ, anyị dị ndụ nye Onyenwe anyị; ọ bụrụkwa na anyị anwụọ, anyị nwụrụ nye Onyenwe anyị; ya mere ma anyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị bụ nke Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Rom 14:8
13 Iomraidhean Croise  

Ma Ọ bughi Chineke nke ndi nwuru anwu, kama Ọ bu nke ndi di ndu: n'ihi na ọ bu n'ebe Ọ nọ ka madu nile di ndu.


Ma nka ka O kwuru, nēgosi aha ọnwu ọ gēji nye Chineke otuto. Mb͕e O kwusiri nka, Ọ si ya, Som.


N'ihi na Devid, mb͕e o jesiri ọb͕ọ-ya ozi, o sitere n'ìzù Chineke da n'ura ọnwu, ewe tọb͕ọ ya n'ebe nna-ya-hà nọ, o we hu ire-uré:


Ma akpọghm ndum ihe, dika ihe oké ọnu-ahia n'ebe mu onwem nọ, ka m'we b͕azue ọsọm, jezu kwa ozi nke m'natara n'aka Onye-nwe-ayi Jisus, ikwusi ozi ọma ahu ike, bú nke amara nke Chineke.


Mb͕e ahu Pọl zara, si, Gini ka unu nēme, ebe unu nākwa ákwá nētiwa kwa obim? n'ihi na edoziwo mu onwem ọ bughi nání ka ewe kem ab͕u, kama inwu kwa ọnwu na Jerusalem n'ihi aha Onye-nwe-ayi Jisus.


Ma madu nile n'otù n'otù n'usoro nke aka ha: Kraist, dika nkpuru mbu; emesia ndi nke Kraist, n'ọbibia-Ya.


dika olile-anya siri ike na ntukwasi-obi nkem si di, na n'ihe ọ bula ọ dighi ihere gēmem, kama na agēme kwa ka Kraist di uku n'arum ub͕u a, otú ọ di mb͕e nile, ma ọ bu site na ndu, ma-ọbu site n'ọnwu, nime nkwuwa-okwu nile.


E, ọ buru kwa na anāwusim dika àjà-ihe-ọṅuṅu n'elu àjà na ifè-òfùfè nke okwukwe-unu, anamaṅuri ọṅu, so kwa unu nile nāṅuri ọṅu:


n'ihi na ọ bu n'ihi ọlu Kraist ka ọ biaruru ọnwu nso, nēkwere itufu ndu-ya, ka o we mezu ihe fọduru unu ime n'ifè-òfùfè-unu n'ebe m'nọ.


Onye nwuru n'ihi ayi, ka ọ gābu, ma ayi nēche nche ma ayi nāraru ura, ka ayi we so Ya dikọ ndu.


M'we nu olu ka ọ nēsi n'elu-igwe da, si, De akwukwọ, Ngọzi nādiri ndi nwuru anwu, bú ndi gānwu anwu nime Onye-nwe-ayi site n'ub͕u a: e, ka Mọ Nsọ nēkwu, ka ha we si na ndọb͕u nile ha dọb͕uru onwe-ha n'ọlu zuru ike; n'ihi na ọlu nile ha nēso ha ga.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan